JAMB 2020: NSE enyela Egoagwụagwụ N16m maka ịbụ onyekachasị mee ọfụma na Jamb 2020

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Otu jikoro ndị injinia na Naijiria a kpọrọ 'Nigeria Society of Engineers' (NSE) enyela Egoagwuagwu Madufokwa, nwa Igbo nwetara akara ule kachasị na ule Jamb afọ 2020, ohere akwụkwọ n'efu ruru nde naira iri na isii.

Ego ahụ bụ maka ịgụ 'Engineering' na mahadum afọ ise.

Egoagwuagwu Agnes Madufokwa, onye Ihiala dị n'Anambara steeti nwetara akara (365) n'ule Jamb, ebe onye na-eso ya bụ Nwobi Okwuchukwu David sikwa Anambara steeti nwetara narị ato na iri isii na atọ (363).

Madufokwa so na ụmụakwụkwọ mmadị iri na isii otu NSE nyere nzere nakwa ego agụmakwụkwọ n'efu maka ime ọfụma n'ule Jamb ụbọchị Tuzde.

E nyekwara ha kọmputa mkpanaka bụ 'laptop' .

Ndị ọzọ ritere elele ahụ si n'aka NSE gụnyere; Nwobi Okwuchukwu David (Anambara), Ojuba Mezisashe Shalom (Edo State - 359); Elekwu Victor Chukwuemeka (Delta - 359); Adebola Oluwatobi Paul (Ekiti - 358); Gboyega Oluwatobiloba Enoch (Ekiti - 356).

Ndị ọzọ bụ Ojo Samuel Oluwatobi (Ondo - 355); Utulu Jebose George (Delta - 355); Osom Akan Awesome (Akwa Ibom - 353); Akakabota Fejiro Simeon (Delta - 352); Ogundele Favour Jesupemi (Kwara-352); Alatise Monsurah Bisola (Oyo - 352) na Adelaja Oluwasemilore Daniel, (Ogun - 352).

Aha onye na-edu ya

Mgbe BBC kpọtụụrụ nne Egoagwuagwu, o kwuru na obi dị ya ụtọ nke ukwuu maka ihe ọma na-emere nwa ya nwaanyị.

O kwuru na n'ezie aha onye na-edu ya dịka aha nwa ya bụ Egoagwuagwu, o weterela ya ihu ọma.

Gọvanọ Obiano nyekwara Egoagwuagwu nkwado

Cheta na Gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano kwere nkw na ọ ga-enye Egoagwuagwu Madufokwa na Nwobi Okwuchukwu nkwado pụrụ iche maka ugo ha tuuru n'ule Jamb nke afọ a.

Madufokwa dị naanị afọ 16 na-atụ anya ịgụ "Industrial Chemical Production" na University of Ibadan, ebe Nwobi na-atụ anya ịgụ "Mechanical Engineering" na Kwara State University.

Dịka Don Adinuba bụ kọmishọna mgbasaozi n'Anambara steeti si gwa ndị ntaakụkọ Anambra Broadcasting Service (ABS), obi Gọvanọ Obiano juputara n'aṅụrị n'ihi etu ụmụ Anambara a si eme ọfụma.

O kwukwara na ọ ga-amasị ya izute ụmụaka abụọ a na nne na nna ha mgbe na-adịghị anya.

Adinuba kwuru na etu ụmụaka abụọ a si mee ọfụma n'ule ha gosiri ihe e ji mara ndị Anambara.

Ọ kọwara etu nne Egoagwugwu bụ Ijeoma sikwa mee ọfụma oge ọ gụchara mahadum n'afọ 1997, dịka ọ bụ onye kacha mee ọfụma na Chemical Engineering na University of Benin.

Emeka Madufokwa bụ nna Egoagwuagwu kwuru na nwa ya nwaanyị mere ọfụma n'ihi na ọ na-agba mbọ; o kwukwara na ụfọdụ mahadum dị na mba Amerịka enyela ya ohere ịbịa gụọ akwụkwọ mana ọ ga na-akwụ obere ụgwọ.

Ijeoma bụ nne ya kwuru na nwa ya nwaanyị dị ka ụmụaka ndị ọzọ isi ruru ụlọ, ịgụ oke akwụkwọ na-amasị nke bụ na ha larugodi obodo, ọ ga na-agụ akwụkwọ oge ọbụla.

Dịka ndị akwụkwo mgbasaozi bụ Punch siri kwuo, ọ bụ ụmụakwụkwọ si Anambra, Edo, Delta, Ekiti, Ondo, Akwa Ibom, Kwara, Oyo na Ogun steeti so na mmadụ iri kacha mee nke ọma na ya bụ ule.

Lee etu ndị lere ule Jamb si mee n'ime afọ atọ gara aga:

Afọ 2019

Ọ bụ nwaamadị Ezenala Ekene Franklin dị nanị afọ iri na ise si Abịa steeti bụ onye kacha nwee akara dị elu na ule Jamb nke afọ 2019.

Ezenala jị akara narị atọ na iri anọ na asaa were bụrụ onye akara ya kachasị elu na ya bụ ule.

Onye na-esote ya bụ Igban Emmanuel Chidiebube sịkwa Abia steeti.

Kama oge mpụta ule a pụtara, onyeisi ngalaba a bụ Ishad Oloyode klwuru na ọ cheghi na Ekene ga-enweta oche ị gụ akwụkwo na Mahadum dịka o rubeghi afo ọ kwesiri iji banye mahadum.

Afọ 2018

Onye akara ya kachasị na ule JAMB nke afọ 2018 bụ Galadima Zakari onye lere ule a n'Ogun steeti bu onye akara ya kacha dị elu.

Zakari si obodo Biu nke dị na Borno steeti.

Zakari nwere akara narị atọ na iri isii na anọ ebe onye na-esote ya bụ Adekunle Jesufemi onye lere ule a n'Abeokuta nwere akara narị atọ na iri ise na asatọ.

Afọ 2017

Dịka ndị ngalaba Jamb ekwughị onye kacha nwee akara dị elu, ndị ntaakụkọ mere nnyocha nke ha were chọpụta mpụta ya bụ ule.

Ọ bụ otu nwaamadị dị afọ iri na isii aha ya bụ Ariori Ibrahim Olabode bụ oinye akara ya kacha elu n'ule JAMB nke afọ 2017.

Olabode ji akara narị atọ na iri asaa na ise were bụru onye nwere akara akachasị elu.

Onye na-esote ya bụ Felix-Ngige Chukwuebuka Joshua sị Anambara steeti ma nwee akara narị atọ na iri na ise.

Onye nke atọ bụ Iworiso Blessing si Bayelsa steeti nwere akara narị atọ na iri na isii.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: