You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Jamb Results: I ji aghụghọ lee Jamb? Nyocha abịala
Akụkọ anọ dị mkpa n'ụtụtụ a
Iji aghụghọ lee Jamb?
Obi mapụwakwa gị makana ngalaba ahụ na-ahụ maka ụle eji abanye mahadum sị na ha ga-amalite nyocha ga-esi 2009 ruo 2019.
Onye is mgbasa ozi Jamb bụ Fabian Benjamin sị Onye asambodo Jamb ya bụ adịbogorja ga-agbara aka.
A ga-enyocha ogbugbu mmadụ na Gombe
Gombe ebe onyeisi ndi uweojii bụ Mohammed Adamu si na ha ga-eme nyocha banyere etu Ihe karịrị mmadụ iri na-enwe anụrị ncheta mbilite n'ọnwụ Jesu jiri nwụ mgbe ụgbọala Onye uweoji nya bara n'etiti ha.
Akụgbụru onye uweojii ahụ na onye Civil Defence o bu mgbe ndị mmadụ wakporo ha ka ihe mgberede a mechara.
Ọkaikpe esepụla aka n'ikpe Okorocha
Ọkaikpe ọzọ esepụla aka n'ihe banyere ikpe asambodo Rochas Okorocha na-arịọ ụlọikpe ka ọ manye Inec inye ya.
Ọkaikpe Okon Abang sị na ọ bụ akwụkwọ Okorocha degara onyeisi ya mere ya ji sepu aka.
Chelsea bụzị ndị anọ
Chelsea asorula na ndị na-aracha piọm na Premier League dịka ọkpụ abụọ ọkpụ ha na Burnley gbara ụnyaahụ nyere ha ohere ịrịgọ bụru ndi nke ato na tabụlụ.
Gee nkeji a ebe a:
Lee ihe nkiri anyị nke taa: