Igbo Landing: Etu ụmụ Igbo si gosi 'ofu obi' n'ihu mkpagbu n'oge gboo

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Agha Biafra bụ otu oge were anya Igbo gosiri na ha nwere 'ofu obi', mana ị ma na nke ahụ abụghị mbụ ha?

Ha egosibuola ụkpụrụ a n' 'Igbo Landing' mere oge gboo.

Oge elu bụ ala ọsa, oge ezi si n'ukwu ụkwa gaa, ndị Igbo na-erefu onye isi ike, onye dara iwu obodo, maọbụ onye kpara arụ.

Ụfọdụ ndị mmadụ bidoro rewe ndị ji ha ụgwọ, ndị merụrụ ala na ndị ha jidere ma obodo na obodo lụọ agha.

Ndị meriri,ha kpụrụ ndị ha meriri, refuo. Ha na-eresị ndị ahịa isi ojii ibe ha.

Mana ka chi na-efo, bido na "15th Century" rue "19th Century", mgbe ndị ọcha batara ala isiojii, ụfọdụ malitere iresi ha ndị ha gbara n'ohu nke a ma dịka, "transatlantic slave trade" na Bekee.

Mgbere mmadụ were ghọọ ahịa ntụ nke na ụfọdụ na-atọrọ mmadụ ibe rewaa ha anya.

N'afọ 1803, n'ụzọ dị ịrịba ama, ụmụ Igbo ruru narị atọ(ụfọdụ akụkọ sị na ha dị iri asaa na ise) e resiri ndị ọcha nọrọ n'ebe a kpọrọ Dunbar Creek dị na St Island na Georgia dị na mba Amerịka nupụ isi jụ ịbụ ohu kama haara mmiri iri ha.'

Ọtụtụ ndị mmadụ n'ala Bekee na-ahụta nke a bụ mbụ ndị mmadụ na-egosi ekweekwe nye mmekpa ahụ n'igwe na mba Amerịka.

Ọkammụta Igbo na mahadum, University of Lagọs, bụ Chigozie Nnabuife kọwara na ihe butere agwa ahụ bụ na : "Ndị Igbo kpọrọ onwe ha Igbo kwetara na ohu abụghị nwa. Ha weere ohu dịka anụmanụ nkịtị."

N'ọnụ ya, "Ya mere na a na-agọrọ ohu mmụọ, e meghị otua ya gbalaga."

"Ha nọ n'ụgbọ were Igbo kpaa nkata kpebie na ha enweghị ike fee nwoke ibe ha ohu, ka anụmanụ, na ọ kara ha mma ịnwụ anwụ. "

"Ha kpebie na ha ruo ebe ebu ha ga,ha jide onwe ha aka dakpuo mmiri."

Akụkọ 'Igbo landing' bụ abụbụ akụkọ si n'aka fere aka nke ndị isiojii Amerịka na-akọ dịka akụkọ ifo tupu e debanye ya n'akwụkwọ n'agbata 1930.

Taa, e nweziri emume e ji echeta ụbọchị ahụ, dịka akụkọ kwuru na mmụọ ndị ahụ ka na-akpagharị ebe ahụ rue taa.

Ka ọ dị ugbua, a na-agụ ihe gbasara 'Igbo Landing' n'ụlọakwụkwọ ụfọdụ dị na Georgia.

Akụkọ ga-amasị gị: