Maurice Iwu: Ọ ka mma ịgbalahụ coronavirus site na iri nri ga-echedo ahụ gị

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọkammụta n'ihe gbasara ọgwụ e si na mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ emepụta bụ Maurice Iwu ekwuola na ọ ka mma mmadụ ichedo ahụ ya ka ọghara inweta ọrịa coronavirus.

Iwu, onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ụbọchị Tuzde, kwuru na-etu enweghị ọgwụ azụzụ, na-enweghị ọgwụ nje 'coronavirus' ugbua, "ọ bụ etu isi chekwata onwe gị site n'iri ezi nri."

O kwuru na nri dịka "ji mmiri ọkụ e ji ụtazi na ose sie ya, ị nụọ ya, ya agbasie gị ahụ."

O kwukwara na ugu, onugbu nakwa akwụkwọ nri ndị ọzọ dị mkpa.

N'okwu ọgwụ ọgwụgwọ coronavirus Iwu sị na e nwere ihe atọ dị n'ala Igbo e were ike inye aka ịgwọ ọrịa coronavirus.

O kwuru n'ụfọdụ ihe ndị a bụ ihe dị n'ọgwụ ahụ o mepụtara nke a na-atụlee ma aga-anabata maka ọgwụgwọ coronavirus.

N'okwu ihe mere gọọmenti etiti ji gbahapụ ọgwụ Maurice Iwu ga were nke ndị mba Madagascar, Iwu kwuru na onye na-azụ ahịa bụ nke masịrị ya ka ọ ga-azụ.

Lekwa ihe ndị ọzọ di mkpa o kwuru:

  • O kwesighị imepewe obodo ugbua n'ihi na coronavirus ka na-agbago.'
  • Ọrịa coronavirus ga-agba etu anyị si ebi ndụ; etu ụwa dị ugbua ọgaghị abụ etu ọ ga-adịzị, onye ọbụla kwesiri
  • Cornavirus ekweghị ime ka di na nwunye nwee mmekọrịta, mana ọ bụrụ n'otu onye n'ime ha bute ọrịa ahụ, o kwesiri ka ha nọrọ iche iche."
  • "Ihe na-eme ụdị nje(virus) a bụ o mee ka ọ laala, ya abịa ọzọ."
  • "Ka e chee 'clinical trials' tupu e kwuo n' ọgwụ a anyị nwetara na-agwọ coronavirus."
  • "Amaghị m ihe mere na gọọmenti anabataghị ọgwụ anyị chọpụtara maka ọgwụgwọ coronavirus."
  • "Anyị ejibeghị ọgwụ coronavirus m chọpụtara arụ ọrụ n'Imo steeti n'ihi na emechabeghị 'clinical trials.'
  • "A maghị m maka ihe e ji nọ n'ọgwụ Madagascar."
  • Ihe ndị dị n'ime ọgwụ nke anyị gụnyere akụilu,guava."
  • Ndị iche na ịba na coronavirus; cornavirus na-abịa n'ụzọ dị icheiche.