You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
President Buhari: Gịnị kpatara Buhari anaghị ekpu 'mask'?
Otu iwu nke gọọmentị etiti tiri iji nye aka n'igbochi mfesa ọrịa coronavirus bụ na onye ọbụla ga na-ekpuchi ihu ya mgbe ọbụla.
Nke a gụnyere mgbe onye ahụ chọrọ ịpụ ezi maọbụ mgbe ya na ndị mmadụ nọ.
Mana onyeisiala Muhammadu Buhari anaghị eme nke a.
Ọtụtụ oge ka onyonyoo Buhari pụtara ebe ya na ndị mmadụ na-eme nzukọ mana ọ gaghị ekpuchi ihu n'agbanyeghi na ndị ọzọ ga-ekpuchicha ihu ha.
Buhari ọ bụzị o tiri iwu ada iwu?
Mana ụlọọrụ onyeisiala akọwaala ụfọdụ ihe mere onyeisiala ejighi ekpuchi ihu ya mgbe ya na ndị ọzọ nwere nzụkọ
Bashir Ahmad bụ onye na-enyere Buhari maka mgbasa ozi soshal midia gwara BBC na onweghi ọrịa ga-efe onyeisiala n'ihi na ndị niile nọ ya n'akụkụ na-ekpuchi ihu ha oge niile.
O kwuru sị: "Nke mbụ bụ na ọbụghị Buhari bụ onyeisiala na-anaghị ekpuchi ihu ya.
"Ị ga-ahụ na ọtụtụ ndị ọchịchị na mba dị icheiche anaghị ekpuchi ihu ha" ka o kwuru.
"Ọzọ bụ na ebe ọbụla onyeisiala nọ, ị ga-ahụ na onye ọbụla nọdebere ya kpuchiri ihu ha.
"Otu ahụike mbaụwa kwukwara na otu onye nwere ike ịhapụ ikpuchi ihu ya ma ọ bụrụ na ndị niile nọ nso kpuchiri ihu ha."
Onye ọzọ kwa na-arụrụ onyeisiala ọrụ aha ya bụ lauretta Onochie kọwakwara nke a n'akara Twitter ya.
Ndị nkịtị kwanụ?
Ọtụtụ oge ka ndị uwe ojii na ndị ọrụ nchekwa na-enye ndị mmadụ nsogbu maka ekpuchighi ihu.
Oge ụfọdụ, ha na-amanye onye naanị ya nọ n'ime ụgbọala ka o kpuchie ihu, n'agbanyeghi na o nweghi onye ya na ya nọ n'ime ụgbọala ahụ.
Nke a ebutela ọtụtụ nghọtahie n'etiti ndị ọrụ nchekwa na ndị mmadụ nkịtị.
Gịnị ka WHO kwuru gbasara 'face mask'?
Otu 'World Health Organisation' kwuru na ọ dịghị mkpa mmadụ ikpuchi ihu ya ma ọ bụrụ na ahụ siri onye ahụ ike.
Ha kwuru na ndị kwesịrị ikpuchi ihu bụ ndị ahụ adịghị maọbụ ndị na-eleta ndị ọrịa.
Ndị ọchịchị ndị ọzọ na-anaghị ekpuchi ihu ha
N'ezie, ọ bụghị naanị Buhari bụ onye ọchịchị na-anaghị ekpuchi ihu ya n'ọgbakọ ọha mmadụ.
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na osote ya bụ Mike Pence anaghị ekpuchi ha.
Boris Johnson, Praịm Mịnịsta mba Briten, bụ onye rịara ọrịa coronavirus ma mechaa gbakee, anaghịkwa ekpuchi ihu.
Onye ọzọkwa bụ Vladmir Putin nke mba Rọshịa.
Mana ị ga-ahụ na ndị niile ha na ha nọ nso anaghị ekpuchikwa ihu ha.
Ugbua, dịka ozi pụtara na osote onyeisiala nke mba Saụt Sudan ebutela ọrịa coronavirus, ndị ọkacha mara na-ekwu na ọ dị mkpa ka onye ọbụla na-echekwa onwe ya nke ọma.