Wike anatala ọsịsa maka ụlọ ndị ọ kụturu n'Eleme

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Gọvanọ na-achị Rivas Steeti bụ Nyesom Wike nọrọ n'ụbọchị Sọnde kụtuo ụlọoriri na nkwari abụọ n'Eleme, bụ nke ọ sị dara iwu mmachi ngagharị o tinyere.

Gọvanọ Wike sị na o nyere iwu ka ụlọoriri ghara ịrụ ọrụ n'oge mmachi ngagharị a, mana onye ndu ndị ntoroọbịa People's Democratic Party (PDP) n'Eleme nupuruisi n'iwu a.

Na ihe mere ha ji kụtuo ụlọ ndị a bụ na otu onye bunyere mmadụ asaa coronavirus na steeti ahụ si n'ụlọoriri.

Wike sị na ihe o mere bụ ihe o kwuru na ọ ga-eme mgbe ọ na-adọ aka na ntị.

Ndị na-arụ n'ụlọoriri ahụ gwara BBC etu ụlọ ndị a kuturu ga-esi metụta ha.

Ụdịrị agwa a ọ kpara wutere ọtụtụ ndị mmadụ, nke mere ha ji na-akatọ ya n'ụzọ dị icheiche.

Ụfọdụ ndị na-ajụ ajụjụ sị "Gọvanọ Wike o nwere ikike ikụtu ụlọ mmadụ maka ịda iwu mmachi ngagharị?"

Onye dịka Raph Uwazuruike bụ onye ndu otu a kpọrọ Movement for the Actualization of the Sovereign State of Biafra (MASSOB), so na ndị katọrọ ihe gọvanọ Wike mere.

Uwazuruike n'ihe onyonyo o wepụtara na soshal midia ji ezigbote iwe gwa gọvanọ Wike okwu dị icheiche.

Ọ sị na Wike o che na ọ bụ naanị ya bụ gọvanọ na Naịjirịa, na ihe ọ gaara eme bụ ịgbachi ụlọ ndị ahụ ma rie ndị nwe ya iwu karịa ikutu ụlọ mmadụ tara ahụhụ rụọ.

Onye ọzọ tinyekwara ọnụ n'okwu a bụ Oby Ezekwesili bụbu mịnịsta agụmakwụkwọ na Naịjirịa.

Ọ sị na ọ dị mkpa ka onye ọbụla nwee nkwanye ugwu n'ime onwe ya tupu ọ pụta ịzọ ọchịchị ọbụla.

Na ọ bụrụ na ikike baa ụdị ndị a n'aka na ha na-egbu ọchụ n'obodo maka e nweghi nkwanye ugwu n'ime onwe ha.

Ezekwesilli sịkwa na ọ ga-adị mma ka ndị nwe ụlọoriri kpụpụ Gọvanọ Wike n'ụlọikpe.

Ihe ndị ọzọ kwuru maka nke a

Otu onye kpọrọ onwe ya Great Oracle jụrụ sị kedụ ebe Wike si nweta ikike ya?

Rita Aduba sị na gọvanọ Wike dọrọ aka na ntị banyere nke a tupu o mee ya, na ndị mmadụ kwesịrị ige ntị n'iwu ndị ọchịchị nyere.

Segalinks kwuru sị na ebe o si ka njọ bụ na Wike bụ ọkaiwu kwesịrị ịma ihe iwu ụlọikpe kwuru maka ụdịrị omume a.

Akụkọ ga-amasị gị: