You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Coronavirus: Ihe mere imechi mba Afrịka n'ihi Coronavirus ji adịchaghị mma
Ọtụtụ mba Afrịka emechiela ngagharị na mba ha iji gbochie mfesa ọrịa Coronavirus, mana dịka Alex de Waal na Paul Richards na-ekwu, ndị nkịtị na-anọghị n'ọchịchị kwesịrị isonye n'usoro e ji ahọpụta atụmatụ ga-arụrụ ha ọrụ.
De Waal na Richards na-ekwu na mba ndị si na mpaghara Afrịka amụtala ọtụtụ ihe site n'ibuso ọrịa ozuru mba ọnụ ndị dịka HIV na Ebola agha, nke bụ na ha ga-ejinwu ihe ha mụtara busokwa Covid-19 agha.
Otu ihe kacha mkpa ha mụtara bụ na ọ bụghị ike otu onye ka e ji alụ ọgụ a, kama na ọ bụ mmadụ niile ga-ejikọ aka.
Nke bụ na otu, ọrịa na-efe efe na-apụta n'ụzọ dị icheiche na mba dị icheiche, ọkachasị dịka ọnọdụ mmekọrịta naanị ndị si n'obodo ahụ ma.
Ọzọ bụ na enweghị usoro mgbochi - ịma atụ mmechi obodo na mmachibido ịpụta ezi - e kwesịrị ime na-ajụghị ndị ọ ga-emetụta ase. Ọ bụ naanị mgbe ndị obodo ahụ so na ntụpụta atụmatụ na usoro mgbochi na ibuso ọrịa ozuru mba ọnụ dị etu a agha, ka ọ ga-enwe isi.
Ọ di mkpa ịhụta Covid-19 a dịka ọrịa Ozuru ụwa ọnụ nke ji obere ihe dị iche n'ibe ya.
Etu ọrịa a si efe bụ otu ihe ebe niile, mana ụdịrị ọsọ o ji efe nakwa usoro o ji efe di iche site n'obodo na obodo.
Etu o si efe ebe ọtụtụ mmadụ bi n'ime ya agaghị abụ etu o si efe n'imeobodo maọbụ obodo na-enweghị ọtụtụ mmadụ. N'otu aka ahụ, ọ bụghịkwa etu ahụ ka ọ ga-esi fee ndị nọ ebe ndị gbara ọsọ ndụ na ndị na-ebi ndụ nkwagharị.
Ibu ọrịa na-enye Afrịka nsogbu dị iche
N'ọrịa ndị ahụ, ihe ndị bu isi bu isi bụ akparamagwa dị ka ekele, mmekọrịta, ịkwọ aka, maọbụ ịnọsapụ anọsapụ.
Ndị ọkachamara nwereike ikwu ihe ha chere n'ihi etu ha chere na o nwereike ịdị, mana naanị ndị si n'obodo ahụ nwereike ịma etu o si metụta ha.
Etu ọrịa si enye Afrịka nsogbu dị iche n'etu ọ dị na mpaghara ụwa ndị ọzọ.
Ndị ọkachamara ji aka na Covid-19 a ga-enye nde kwuru nde mmadụ bu ọrịa dịka ụkwara nta na ndị ime ahụ esichaghị ike dịka ndị bu HIV, ezigbo nsogbu.
Amachabeghi ihe ibute ọrịa Coronavirus a ga-eme ndị na-arịa ọrịa ịba maọbụ ndị agụụ na-amịkpọ ahụ.
N'aka ọzọ, ndị mejupụtara Afrịka bụ ndị ka na-etolite etolite.
Otu ihe e kwuru so mee ka ọnụọgụgụ ndị Coronavirus gburula n'Itali dị elu etu ọ dị bụ na ha nwere ọtụtụ ndị agadị/okenye na mba ahụ.
Ihe ruru pasentị 23 na mba ahụ bụ ndị gafegoro afọ 65, bụ ndị a na-ekwu na ọrịa a kacha anyụ ịkpakwụ.
Mana n'Afrịka, naanị ihe na-erughị pasentị abụọ bụ ihe gafegoro afọ 65, nke nwereike ịbụ ihe mere etu ọrịa a si egbu ji pee mpe na mpaghara a.
N'ihi nke a, ọ doro onye ọbụla anya na mba ọbụla n'Afrịka ga-eji aka ya mepụta etu ọ ga-esi luso ọrịa ọgụ, n'ụzọ ga-adabara ha.
Gọọmenti kwesịrị ịgwa ndị mmadụ okwu
Gọọmenti enweghị ihe ndekọ a ga-ejinwu sị na "ọ bụ etu a ka ọ dị", ha agaghị enwetanwukwanụ ya ọsịsọ.
Mana e nwere etu ka mma, e meburula mbụ iji enweta ndekọ a: nke bụ ịkpanyere ndị obodo nkata. Ndị dọkịnta na ndị ọkachamara n'ihe gbasara ọrịa na-efe efe ga-enwetanwu nke bụ eziokwu n'ihe sayensị na-ekwu, ndị obodo eweta ihe ha ma gbasara etu ha si lụọ ụdịrị agha a mgba gara aga.
Imechi obodo abụghị mmadụ niile kwesịrị ime ya n'ihi na ndị ọzọ mere ya.
Ndị na-adabere n'ihe ha hụrụ kwa ụbọchị iji leta ndụ ha, zụọ nri na ihe ndị ọzọ, Imechi obodo obere oge bụ ọnọdụ "lee ha lekwa ụbịam".
Maka ndị nke nọ na ntaramahụhụ n'ihi enweghị ọrụ, anwụ na ụbịam na ihe ndị ọzọ, ikwu na ibe bụ ndị na-elekọta ha.
Imechi obodo bụ ịnapụ ha ohere nlekọta a, igbawa ha aka kpamkpam.
Ọ bụrụ na ndị mmadụ ahụghị nri rie, ọ baghị uru Imechi ebe niile. Ndị ogbenye ga-asị na ọ ga-aka a ha mma ibute ọrịa a kama ịnọ ka agụụ gụgbuo ha.
Ụdịrị ihe a mere na mba Liberia oge Ebola malitere inye ha nsogbu n'afọ 2014.
Gịnị ka Afrịka kwesịrị ime?
Afrịka kwesịrị ime ngwa ngwa ma jiri ihe ha nwere n'ime ụlọ lụọ agha a.
Ọnọdụ ahụike na ụlọọgwụ dị na mpaghara ụwa a ahụ nke tọrọ fada. Ọrịa Covid-19 bụ nke chọrọ gbatagbata n'etu bụ gọọmenti ka ọ ga-esi n'aka.
Ụlọọgwụ ndị dị n'Afrịka chọrọ ihe e ji enyocha ọrịa, ihe ndị e ji edebe ahụ ọcha, ihe ndị ọrụ ahụike ji ekpuchi ahụ nakwa igwe e ji eku ume.
Ka ọ dị ugbua, ndị mbaụwa na-abụ ihe ndị a abụ, chefuo Afrịka.
Dịka ndị mba ofesi na-achọ ihe ha ga-eme, ndị ọchịchị Afrịka kwesịrị ịchọ ụzọ ha ga-esi gbakọọ aka nweta ihe ndị ha chọrọ.
Ọzọ bụ iwepụta maọbụ ịrụpụta Ụlọọgwụ na ebe a ga-anọ na-elekọta ndị bu ọrịa a.