Coronavirus Lockdown: Ugbua I nwere ohere, lekwa ihe I kwesịrị ikuziri ụmụ gị

A na-ekwu na ụmụaka bụ onyinye si n'aka Chineke mana ịchịkọta ha ugbua dịka gị na ha nọ n'ụlọ n'oge mmachi ngagharị maka ọrịa coronavirus, adịghị fechafecha.

Kedụ ka ọ si aga na be gị?

Cheta na ndị nke ka nọ n'ụlọakwụkwọ ọtaakara maọbụ praịmarị agaghị aghọtacha ihe na-eme.

Mana ndị nke na-agụ sekọndrị nwere ike ịghọta ihe ha ji nọrọ n'ụlọ apụghị iro.

Ihe ka mkpa ibu n'obi bụ na ụmụaka mechiri akwụkwọ n'oge erughị eru nke mere na ha amụchaghị ihe niile ha kwesịrị ịmụta.

Ọtụtụ nne na nna bụ ndị na-apụ n'ụtụtụ ma bata n'abalị, nke bụ na ndị nkụzi na ndị na-eledo ụmụaka anya bụ ndị na-ahụzi maka ọzụzụ ụmụaka.

Mazi Peter Ezembu bụ onye ọnụ na-eru n'okwu maka ihe gbasara ọzụzụ ụmụaka tụnyere anyị azụ etu nne na nna ga-esi kụziere ụmụ ha ihe n'oge mmachi a.

Kuziere ụmụ gị onye ha bụ

Mazi Ezembu kwuru na dịka nne na nna na-akụziri ụmụ ha agụmakwụkwọ n'oge a, ọ dịkwa mma ka e were ohere a kuziere ha maka omenala ha.

O kwuru si: "Nne na nna ọrụ e nyeghị oghere ịkụziri ụmụ ha asụsụ na omenala obodo ha ga-eji oghere a kụziere ha asụsụ ha.

Ezembu rụrụ aka iji akụkọ ifo na ụfọdụ egwu ndị Igbo ji kụziere ụmụaka ọmụmụ n'oge mmachi a.

Kụziere ha maka ezinụlọ ha sị

Ezembu si na ugbua bụkwa ohere iji kpọtụrụ ndị ezinaụlọ na-ekwentị nke onyonyo ma mee ka ụmụ gị mara ndị bụ ụmụnne ha.

Ọ kwuru na nke a na-enye aka n'otuto ụmụaka.

Ezembu kwuru sị, "oge a a bụchaghị ogbatauhie dika ọtụtụ ndi nne na nna si chee, kama ụnụ were ohere a kụziere ụmụaka ụnụ ọmụmụ maka omenala na ezinaụlọ ebe ha siri bia".

N'aka nke ọzọ, e nwere ụfọdụ atụmatụ nne na nna ga-eji hụ na ụbụrụ ụmụ ha akpọchighị n' oge a, ọkachasi ndị na-akwado ule dịka WAEC.

Atụmatụ ndị a gunyere:

  • Emume agụmakwụkwọ nke gọọmenti na ụlọ mgbasa ozi wazobia fm na-eme n'igwe redio iji kụziere ụmụ akwụkwọ mmachi a metụtara.
  • E nwere nke bekee kpọrọ "mobile app" ndị nne na nna nwere ike itinye na-ekwe ntị ha ma iji kụziere ụmụ ha ihe.
  • Nne na nna nwere ike ị ga na intaneti nke dịka 'www.akwukwo.com' ebe ha ga-ahuta etu ha ga-esi kụziere ụmụ ha ihe.
  • Kama ọ dị mkpa na dịka ị na-enye ụmụaka gị ohere intaneti chetakwa tinye nchekwa ụmụaka nke bekee na-akpọ "child safe browsing" iji hụ na ụmụ gị agaghị ebe ha ekwesịghị ịga.
  • Ihe onyonyo ndị ọzọ dịka 'YouTube' nwere ebe ụmụ akwụkwọ ga-aga wee kwado onwe ha maka ule dị iche iche nke gunyere WAEC.
  • Ịnọkọ gwuo egwu ma nwekwaa mkparịtaụka. Oge niile abụghị akwụkwọ, akwụkwọ, ohere a dị mma ịnọtu ala ka gị na ụmụ nọrịa.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: