Coronavirus in Nigeria: Nwaada Igbo ahụ bi n'Amerịka anyị gbara ajụjụọnụ ebughịzikwa coronavirus

Nọsụ dị ime bi na New York gwara BBC Igbo na ya bu Coronavirus, ebughịzị ya.
Nwaanyị ahụ na-achọghị ka akpọ aha ya kwuru na o mere nyocha ọzọ wee chọpụta na o bughịzi ya.
Dịka ụwa niile na-ama jiji maka ọrịa coronavirus, nwaafọ Naịjirịa bụ Chi Onu ekwuola na ọrịa a abụghị ikpe ọnwụ.
Chi Onu bụ onye ọrụ ahụike n’obodo New York nke mba Amerịka.
Ọ bụ ebe ọ na-eleta ndị ọrịa ka o butere coronavirus.
Mana o kwuru na onweghi ihe ọbụla mere ya kemgbe ahụ.


O kwuru sị: “Oge a chọpụtara na m nwere coronavirus, akwụsịrị m ọrụ ka m ghara ibufe ya ndị ọzọ.”
“O ruola ụbọchị 13 m mechara nnyocha mana onwebeghi ihe ọbụla gosiri na ahụ adịghị m.”
“Ma di m na ụmụ m, onweghi onye ahụ na-arịa na-agbanyeghi na mụ na ha na-enwe mmekọrịta etu anyị si emebu.”
Chi Onu kwuru na ndị coronavirus na-emesi ike bụ “ndị nwere ọrịa ngụgụ maọbụ ọrịa obi, ndị na-enwe nsogbu iku ume, ndị nwere ọrịa kansa na ndị mmgbochi ọrịa ha (immune system) esichaghị ike.”
Ọ dụrụ ọdụ ka ndị mmadụ na-eri mkpụrụosisi na akwụkwọ nri ma zeere mmiri oyi, ‘ice cream’ na ihe ndị jụrụ oyi nke na-enye nje coronavirus ohere ịmụba.
O kwukwara sị: “Onye ọbụla atụla egwu, kama kpachapụ anya.”
“Ịtụ egwu nwere ike ịkpata mgbochi okuku ume nke ga-eme ka mmadụ chee na ya nwere ọrịa coronavirus.”
“Coronavirus dị n’ezie. Ya bụ ọrịa ariala m, riakwaa ọtụtụ ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ, nakwa ọtụtụ ndị m na-eleta dị ka ‘nurse’.”
“Ọrịa a egbuola ọtụtụ, mana ọtụtụ agbakeekwaala.”
Chi Onu kwuru ka onye ọbụla gee ntị ma rube isi n’iwu gọọmentị.
“Nọrọ n’ụlọ, zekwaara mmekọ gị na ndị mmadụ ka ị ghara ibute maọbụ bufee mmadụ ọrịa.”