You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Imo state News: Eyigharịala ikpe Ihedioha na Uzodinma ruo echi
Ụlọikpe kachasị eyigharịala ụbọchị ileba anya n'ikpe Emeka Ihedioha na Hope Uzodinma ruo Tuzde 3 Maachị 2020.
Ikpe a bụ nke mmadụ asaa nọ n'isi ya mere nke dịka ọkaiwu Ihedioha bụ Kanu Agabi si rịọ na-arịọ ka e yigharịa ya.
Agabi sị na ọ bụ eziokwu na e kwesịrị ilebanye anya n'ikpe a taa mana ọkaiwu Uzodinma bụ Damien Dodo gbara ha akwụkwọ ọhụrụ n'ụlọikpe taa.
Ọ sị na nyigharịa ga-enye ha ohere ileba anya n'akwụkwọ ahụ ma zaghachị ọkaiwu Uzodinma n'akwụkwọ ha gbara.
Mana ọkaiwu Uzodinma na nke ụlọorụ Inec sị na ha dị na njikere ka e leba ikpe a anya taa.
Taa ka ụlọikpe Kachasị ga-atule arịrịọ Emeka Ihedioha na-arịọ ka ha lebanya na mkpebi ha banyere ọchịchị gọvanọ Imo steeti.
Ihedioha na ndị na-akwado ya sị na ụlọikpe kachasị ekpeteghi ikpe ha site n'ịnapụ ya ọchịchị ma nye ya Hope Uzodinma.
Ọ bụ n'ụbọchị 18 nke ọnwa Febụwarị ka ụlọikpe a malitere ịtụle ikpe a mana ha gbatịrị ya ruo ụbọchị 2 ọnwa Maachị 2020.
Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ ma "Ihedioha ọ ga-achịta aja n'ụlọikpe taa?"
Na mba Korịa
Onyeisi ụlọụka Shincheonji nke Jesus Kraịt dị na mba Saụt Koria bụ ebe ọrịa coronavirus malitere gbasawa arịọla mgbaghara maka ikesasị ọrịa ahụ na mba ha.
Lee Man-hee buru ikpere n'ala ma hudata isi ya n'ime ọgbakọ ndị ntaakụkọ e mere na mba ha.
N'egwuregwu
A ga-awa Eden Hazard na-agbara Real Madrid ụkwụ n'ụbọchị Tọzde na mba Amerịka maka mmerụ ahụ o nwere.
Hazard bụ onye si Chelsea gaa Real Madrid na 2019 ahụbeghi gbaa kamgbe ahụ.
Nkeji
Ihe onyonyo ga-amasị gị
N'Amerịka
Pete Buttigieg bụ onye meriri ntuliaka nke izizi abụọ eji ahọpụta onya ga-eburu ọkọlọtọ pati Demokrat zụọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka awụsala ọwa.
Buttigieg pụrụiche maka ọ bụ ya bụ onye mbụ na-alụ nwoke ibe ya zọrọ ọkwa onyeisiala Amerịka.
Agha dị n'etiti Tọki na Sirịa
Mba Tọkị agbatuola ụgbọelu agha abụọ nke mba Syria ma tụkwaa ogbunigwe na otu ọdọụgbọelu.
Nke a na-abịa dịka ndị agha Siria gbuchara ndị agha Tọkị iri atọ na atọ n'ụbọchị Tọzde izuụka gara aga.
N'egwuregwu
Real Madrid ji ọkpụ goolu abụọ a na-asaghị asa chaa chaa wee gwọọ Barcelona ịba ka ha zutere n'ọgbọegwuregwu Santiago Bernabeu.
Goolu abụọ ahụ si n'aka Vinicius Junior na nkeji 71 na nke Mariano Diaz nyere na nkeji 90+2 zuru ịgbawa ndị Barcelona chere na ha ga-enweta mmeri gaara eme ya nke ise ha na-emeri ha n'ime nzukọ isii ikpeazụ ha.
Nkeji