Nigerian Pastors: "A kpaa gị ị pụọ n'ụzọ" na okwu ndị ọzọ e ji mara ndị ụkọchukwu

Ọtụtụ oge ka ndị ụkọchukwu na Naịjirịa na-ekwu okwu na-eme ka ebe niile nwuru ọkụ.

Mana ọtụtụ n'ime ha bụ ndị e ji okwu dị aṅaa mara, nke bụ na ebe ọbụla ị nọ nụ olu ha nakwa okwu ha, ị mara onye kwuru ya.

Ụfọdụ ndị ụkọchukwu bụ ndị malitere iwu ewu n'ihi ihe ha kwuru, ebe ndị ọzọ na-ekwu ihe ha na-ekwu iji mee ka ndị mmadụ jiri ya mara ha nke Bekee kpọrọ Trademark.

Lee okwu e ji mara ụkọchukwu ndị a:

1) Enoch A. Adeboye:

Nwanne ị bụzịkwa onye Naịjirịa ma ọ bụrụ na ị maghị onye na-ekwu "Let somebody shout Hallelujah" ka ọ bụzị "Say that amen louder"?

Adeboye rigohaala n'elu ọlta, otu n'ime ihe mbụ ọ na-ekwukwarị bụ ka ndị mmadụ tie mkpu Hallelujah; nke a emeela ka onye ọbụla mara na ọ bụ ya na-ekwu okwu.

Adeboye bụ onyeisi ụlọụka Redeemed Christian Church of God nke a na-akpọ RCCG n'ịchafụ.

2) David Oyedepo:

Ị ga-ama na ị nọ na Winners Chapel mgbe ị nụrụ "Good news! The Lord has done it again".

Ọ na-ekwukwarị nke a ma e nwee nkwuputa ọkachasị nke gbasara ihe iribeama.

Oyedepo bụ onyeisi Living Faith Church nke e ji Winners Chapel mara.

3) Temitope B Joshua (T.B Joshua):

Ị chọrọ ịma ma ọ bụkwa olu ya ka ị na-anụ, tinye ihe onyonyo gị n'ebe a kpọrọ Emmanuel TV.

Ebe ahụ ka ị ga-ama ma ọ bụ T.B Joshua na-ekwu okwu mgbe ị ga-anụ "touch your screen" nakwa "Emmanuel"!

Onye amụma Joshua bụ onyeisi ụlọụka Synagogue Church Of All Nations.

4) Chukwuemeka Ohanaemere:

Ị bụrụ nwaafọ Naịjirịa ọkachasị onye Igbo, ị gaara anụla maka onye a na-akpọ Odumejeje maọbụ "Liquid Metal", "The Lion Himself".

Ohanaemere ekwuola ọtụtụ ihe e ji echeta ya; gụnyere "Onye battery ya fọrọ one bar ọ na-agba game?", "Anaghị akpọ ọga n'express", "Onye gba ọtọ a na-etinye aka n'akpa?", "A na-ahụ ọka na filling station?" nakwa "A kpaa gị ị pụọ n'ụzọ ka a kpaa onye ọzọ".

Ọ bụ onyeisi ụka Mountain Of Holy Ghost Intervention And Deliverance Ministry.

5) Ejike Mbaka:

Fada Mbaka ekwuola ọtụtụ okwu mụnyere ọkụ ma kpalite ndọrịtaụka n'etiti ndị Naijiria ọtụtụ oge.

Mana ndị nke kacha bụrụ njirimara ya ọ ga-abụ ị nụ ya ị mara na ị garuola ebe ọ nọ bụ "Tem tem for Jesus", "Ụmụ ikuku eh" nakwa "Onye eze ibe m".

Mbaka bụ onyeisi Adoration Ministries dị n'Enugwu steeti.

6) Chris Oyakhilome:

Oyakhilome so na ndị ụkọchukwu ụlọụka ha dị na mpaghara ụwa dị iche iche.

Okwu e ji mara ya gụnyere "So mightily grew the word of God and prevailed",

Ọ bụ onyeisi ụlọụka Believers' Loveworld nke e ji Christ Embassy mara.

7) David Ogbueli:

Ogbueli so na ụkọchukwu ndị anaghị "enyekarị nsogbu" na Naịjirịa, mana o so na ndị ụlọụka ha buru ibu ma dịrị na mpaghara Naịjirịa dị iche iche.

Okwu ndị e ji mara ya gụnyere "Let them have dominion", "how do you create someting out of nothing" nakwa "God's principles never change".

Ọ bụ onyeisi ụlọụka Dominion City Worldwide.

Kedụ nke ụkọchukwu ụlọụka gị na-ekwukarị?

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị: