UBA Sack: Ọchụchụ anyị biara na mberede - Onye ọrụ UBA

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

"Ọ bụ mgbe m rụchara ọrụ n'ụbochi Fraide ka a kpọrọ anyị were sị anyị dee akwụkwọ arụkwaghị m" etu, otu Josephu Agumadu( ọ bụghị ezi aha ya) onye ụlọọrụ 'United Bank for Africa' (UBA) a chụrụ n'ọrụ na nso nso siri nata ozi na a chụọla ha n'ọrụ.

Agumadu, onye gbara BBC Igbo ama na ya arụọla ọrụ n'ụlọakụ afọ iri na abụọ dịka onye na-ata ego (teller) so na mmadụ puku anọ ụlọakụ UBA churu n'ọrụ n'afọ ọhụrụ a.

Mana kama ikwu maka ndị ha chụrụ n'ọrụ, ụlọakụ UBA na-akụ ekwe mmadụ 4000 ha were n'ọrụ n'akara igwe okwu Twitter ha:

Nwoke , onye gbara ama na ya ji asambodo 'OND' banye n'ọrụ ahụ ma mechara nweta B.Sc kwuru na "ọtụtụ ndị a chụrụ n'ọrụ bụ ndị 'Teller'".

"Anyị dịbu 'teller' atọ, a kpọtara ndị teller ọhụrụ atọ kemgbe ọgw ụgwụ afọ ha soro anyị na-arụkọ.

Nwoke ahụ onye kwuru na ya bidoro nyowa agwa a na-akpaso ha dịka e wetara ndị ọhụrụ n'ọgwụgwụ 2019 ma gbaa mbọ ịhụ na ha kuziere ha ọrụ tupu af ọ gara aga agwụ.

"Onyeisi nlekọta anyị na-ekwukarị 'bido n'ọnwa Janụwarị."

"Ọ bụ ka ihe mere ka anyị matara nebunobi ha bụ iji ndị a anyị kuziri ọrụ dochie anyị."

Dịka ọchụchụ n'ọrụ metụtara ọtụtụ ndịọrụ nọ n'alaka UBA dị n'akụkụ Naijiria dị iche iche, ụlọakụ ahụ buliri ụfọdụ dị mmadụ n'ọkwa, ebe ha tinyere ego n'ụgwọọnwa .

Agumadu kwuru na ha kwụrụ ya ụgwọ ọnwa isii dịka ego laba ezumike mana ọchụchụ n'ọrụ a dara ya na mberede mere Naijiria dị ya ka Ghana.

Ọ gwara BBC sị, "Ka o dị ụgbụ a, amaghịzị m ihe ọzọ m ga-eme".

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: