You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anambra Christmas Decoartion: 'Ọ bụghị gọọmentị na-emezi Anambara maka ekeresimesi'
Gọọmentị Anambra Steeti akọwaala ihe gbasara ebubo oke mmefu ego ndị mmadụ na-ebo gọvanọ Willie Obiano.
Otu a kpọrọ 'Human Rights Liberty Access and Peace Defenders Foundation' (HURIDE) kwuru na Obiano wepụtara ihe karịrị otu ijeri naira iji chọọ Anambara Steeti mma maka ekeresimesi.
Onyeisi otu ahụ bụ Dede Uzor kwukwara na ego ahụ karịrị ego gọọmentị ji arụ ọrụ mmepe ndị ọzọ na steeti ahụ.
Mgbe BBC kpọtụụrụ Uzor, ọ kọwara na ọ bụ na Soshal Midịa ka ha nwetere ya bụ akụkọ.
Ọ kọwakwara na gọọmentị ekweghị akọwara ha nke ọma mgbe ha jụrụ ese maka ebubo ahụ.
Ihe gọọmentị Anambra steeti kwuru
Mana Don Adinuba bụ Kọmishọna mgbasa ozi n'Anambra kwuru na ebubo ahụ niile bụ asị ọcha.
Adinuba jụrụ sị: "Ego ole ka Anamabra steeti na enweta n'ọnwa ha ga-eji mefuo otu ijeri naịra na ụma maka ndozi ekeresimesi?"
Adinuba kọwara na Anambra steeti na agba mbọ ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa, na gọọmentị enweghị ego ha na-emefu emefu.
O kwuru na ọbụ ụloorụ dị iche iche na enye aka imezigasị ebe ụfọdụ na steeti ahụ maka ekeresimesi.
Kọmishọna ahụ kwukwara na ọbụ aka chịburu steeti ahụ bụ Peter Obi na-agbasa asịrị na Obiano na-emefu ego n'ụzọ ekwesịghị ekwesị.
O kwuru na ọbụ Val Obi bụ onye enyemaka Peter Obi depụtara ya bụ akụkọ ụgha.
Ihe Val Obi kwụrụ
Mgbe BBC kpọrọ Val Obi, o kwuru na aka ya adịghị n'akụkọ ahụ.
N'okwu ya: "Onye sị na onwere ihe m dere, onye ahu wepụta ya."
Obi kwuru na onweghị etu mmefu ego goomentị si gbasata ya.
Akụkọ ga-amasị gị
Ihe nkiri ga-amasị gị: