The First Temptation of Christ: Netflix o mere Jesus arụ?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

#BoycottNetflix na-ewu na soshal midịa dịka ndị mmadụ na-egosi iwe ha maka ihe nkiri ọhụrụ ụlọọrụ ihe nkiri ahụ wepụtara a kpọrọ 'The First Temptation of Christ'.

Ihe karịrị nde mmadụ na-ekiri 'Netfilix' binyere aka n'akwụkwọ iji kwụsị ụlọọrụ ahụ iwepụta ihe nkiri ahụ makana ọ na-akparị ndị otu ụka kraisti.

Kedụ ihe dị n'ime ihe nkiri a?(Ihe mgbawa obi juru ya)

Ihe nkiri a bụ ihe ọkpaọchị nke otu nọ na Brazil a kpọrọ Porta dos Fundos (azụ ụnọ) wepụtara.

O ruru nkeji iri anọ na isii na-egosi ebe Joseph na nwunye ya Mary na-ezukọrịta na be ha.

Ọ malitere ebe ụmụnwoke atọ nwere amamihe na-achọ "Jesu" site na kpakpando.

Ka ha fuchara ụzọ, ha mechara rute n'ụlọ Mary na Joseph.

Ha abụọ nọ na-akwado emume ncheta ọmụmụ "Jesu" nọ n'Ọzara kamgbe afọ 40.

"Jesus" mechara bata njem ọ nọ n'ọzara kamgbe afọ iri anọ, ya na ọyị ya nwoke akpọrọ Orlando.

Ihe nkiri a na-akọwa na "Jesus" na Orlando na-enwe mmekọrịta nwoke na nwoke mana "Jesus" gọrọ ụkwụ na aka ya sị na ya na Orlando bụ naanị ọyị na ọyị.

Ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere nke butere echiche a.

Mana n'ikpeazụ, Orlando gosipụtara onwe ya dịka ekwensu bịara ịnwa "Jesu" ọnwụnwa n'ọzara, ma na-achọ ka ọ dachapụ n'oku Chineke kpọrọ ya.

Ka o si dị ugbua, Netflix azachịghabeghị mkpesa ndị mmadụ na-eme maka ihe nkiri a.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia maka ihe nkiri a

@APOSTLESULEMAN rịọrọ ndị mmadụ ka ha kwụsị ikiri Netflix.

@elnathan_john kwuru na ebe ndị ụka Kraisti na-akatọ ndị ọzọ na-akpọ ha ndị ekweghị , ha na-ekwu ka aghara ịkatọ nke a?

@LawrenceOkoroTL kwuru na ya ga-agbajọ Netflix.

@aspirin_n kwuru na ya bụ ihe nkiri akwanyeghị ụka Kraisti ugwu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Ihe nkiri a ga-amasi gị