You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Gbagharanụ arụ na-eme n'ụlọ ụka' - Pope Francis
Popu Francis kwuru na ya nwere ihere na obi mgbu maka ihe arụ a ndị ụkọchukwu na-emeso ụmụaka ma rịọ ka ndị ihe a metụtara gbaghara.
"Obi m na-agara ndị bishọp ụmụnne m, n'ihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka anyị rịọ mgbaghara ma kwado ndị ihe ọjọọ a metụtara"
Popu kwuru, "Agbanyeghị na anyị na-agba mbọ ka ihe ọjọọ ghara imezi."
Popu kwuru ihe ndị a oge gwara ndị ozi mba Chile okwu na Santiago de Chile.
Na mbido izu ụka a, Vatican weghara otu ụlọ-ụka Katọlik dị na Peru ebe e boro onye ụkọchukwu na ọ na-emetọ ụmụaka.