Ebola Vaccine: Chukwu azaala ekpere Afịrịka

    • Onye dere ya, Chioma Obianinwa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo

Otu ahuike mba ụwa akwadola otu n'ime ọgwụ ndị arụpụtara maka iji gbochie ọrịa ebola.

World Health Organisation kwuru na nke a ga-enye aka iji hụ na ọrịa ọjọọ a kwụsịrị ịgbasa n'ọtụtụ mba Afịrịka dị icheiche ebe ya bụ ọrịa na-akpa mkpamkpa ugbua.

Nkọwa gbasara ọgwụ mgbochi Ebola a

WHO depụtara n'akara webusaitị ha na ọ bụ ụlọ ọrụ Merck na-emepụta ọgwụ na mba United States ama ama n´ụwa niile rụputara ya bụ ọgwụ mbochi na ọgwụgwọ.

Ha kọwara na a na-agba ọgwụ ahụ bụ Ervebo dịka ọgwụ ọgbụgba.

WHO kwuru na nke a bụ otu ụzọ n'ime ọgwụ ọzọ a ka na-enyocha ka ọgwụ ga-agwọ ma gbochie Ebola ba ụba n'ọdịnihu. Ha kwuru na a ga-ebido nwetawa ya bụ ọgwụ n'etiti afọ 2020.

Ebola emeela arụ!

  • Ihe karịrị mmadụ puku iri na otu anwụọla kamgbe ọrịa a malitere ọzọ n'afọ 2014 na West Africa nke gunyere Patrick Sawyer bu ya bata Naịjirịa nakwa ezigbo Nwaanyị gbochiri nfesa ya bụ Dr Stella Ameyo Adadevoh
  • Ebola emeela ụmụaka puku kwuru puku nwa enwe nna, enwe nne dịka 'United Nations International Children's Emergency Fund' (UNICEF) si depụta.
  • Naani n'afọ 2019 ka e nwere ndị ọrịa a metụtara karịa mgbe ọ malitere n'afọ 1976 na mba 'Democratic Republic of Congo.'
  • E nwere ụfọdụ mba a gaghị ehibenwu ọgbakọ gbasara ụwa maka mkpamkpa ọrịa Ebola na-akpa ebe ahụ.
  • Ngalaba World Food Programme na-ekwu na ego nri rigoro ogọ pasenti iri abụọ na anọ.

Ka anyị chetara unụ ihe ụnụ kwesiri ma maka ọrịa a

  • Ahụ ọkụ , oke ọbara ọgbugba na mmebi ahụ.
  • A na-esi n'asọ mmiri, ọbara nakwa ọsịsọ enweta ya bụ ọrịa
  • Ọ na-eji ụbọchị ruru iri abụọ na otu abawanye n'ahụ mmadụ
  • A na-esikarị na usu ebutekarị ya bụ ọrịa

Mana n'ime ihe niile a , ụmụ mmadụ g-ekutu ume na enwela ọgwụ ga-egbochinwu ma gwọkwa ya bụ ọrịa.

Akụkọ ga-masị gị