Tam David-West anwụọla n'afọ 83

Tam David-West

Ebe foto si, Other

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye bụbu Minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ Tam David-West anwụọla n'afọ 83.

Onyeisiala Mụhammadu Buhari riri uju maka ọnwụ Maazị David-West rụrụ ọrụ n'okpuru ya n'akara Twitter ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Maazị David-West bụbu onye ọkammụta n'ihe banyere nje ma rụọ ọrụ dịka Minista site n'afọ 1983 ruo 1985 mgbe a chuturu Buhari n'ọkwa dịka onyeisiala.

Ọ rụkwara dịka Minista na-ahụ maka ọnatara chị, ọkụ nakwa igwe n'oge ọchịagha Ibrahim Babangida.

Ka Buhari malitere njem ị bụ onyeisiala ọzọ n'afọ 2015, David-West so na ndị kwenyere na ya nke ọma.

Ọ gwara BBC mgbe ahụ na Buhari ga-eme ọfụma, ọkachasị n'ebe o si metụta mmanụ agbịdị site n'ihazigharị ngalaba ahụ ma rụzie ụlọọrụ mmepụta mmanụ Bekee kpọrọ "refinery".

Naịjirịa amalitela ihiwe ebe a na-arụ ụgbọ oloko

Yemi Osinbajo

Ebe foto si, @ProfYOsinbajo

Gọọmentị etiti amalitela ịrụ ụlọọrụ ebe a na-emepụta akụrụngwa ụgbọ oloko na Kajola dị n'Ogun Steeti.

Ọ bụ osote onyeisiala bụ Yemi Osinbanjo hiwere ntọala e ji arụ ụlọọrụ a n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba.

Mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi sị na ụlọọrụ a dị n'okporoụzọ oloko si Legọs gawa Ibadan ga-abụ nke mbụ na Naịjirịa.

Ọ sị na a ga-eji ya arụpụta akụrụngwa ụgbọ oloko dị iche iche eji arụ ọrụ na Naịjirịa nakwa na mba ndị ọzọ.

Ọ sị na ọ bụ ụlọọrụ China Civil Engineering Construction Corporation (CCECC) na-arụ ya site na nkwekọrịta ha na mịnịstrị ụgbọala nwere n'afọ 2018.

Ụlọọrụ CCECC sị na ha ga-arụpụta ụgbọ oloko dị narị ise n'ime otu afọ..

Osote onyeisiala Osinbanjo sị na ijikọta ọdụ ụgbọmmiri na nke ụgbọ oloko ga-eme ka azụmaahịa na Naịjirịa nakwa Afrịka mụbaa.

N'ofesi

Ndị pati na-anọghị n'ọchịchị na mba Bolivia

Ebe foto si, EPA

Oke ọgbaghaara dị na mba Bolivia maka arụkwaghịm n'ọrụ onyeisiala ha bụ Evo Morales gbara n'ihi ngagharịiwe ha mere ọtụtụ izuụka megide maka ntuliaka ọjọọ.

Morales rituru n'ọkwa ngwangwa onyeisi ndịagha ha pụtara n'ọha sị ya hapụ ọkwa ya.

N'egwuregwu

Pep Guardiola

Ebe foto si, Reuters

Onweghi ntaramahụhụ a ga-enye onye nchịkọta Manchester City bụ Pep Guardiola maka agwa ọ kpara mgbe Liverpool meriri ha n'asọmpị ụnyaahụ.

Mgbe a jụrụ Guardiola, ọ sị na o nweghi ihe ọjọọ o mere karịa 'Daalụ nke ukwuu' ọ sịrị onye ogbu opi bọọlụ

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ndị Ghana agbachiela ụlọ ahịa ndị Naịjirịa ọzọ