You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụlọọrụ Onyeisiala akọọwaala ihe kpatara e ji chụọ ndị enyemaka osote onyeisiala
Ụlọọrụ Onyeisiala akọọwaala ihe e ji chụọ ọtụtụ ndị enyemaka osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo.
Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru onyeisiala Muhammadu Buharị kọwara nke a na mgbede Fraịde.
O meela abalị olemole akụkọ malaitere ifesa na a chụrụ ọtụtụ ndị na-enyere Osinbajo aka n'ọrụ.
Mana ụlọọrụ onyeisiala ekweghị ekwupụta ya ruo taa.
N'ozi ya n'ụbọchị Fraidee, Shehu kọwara na gọọmentị etiti na-ebelata aka na mmefu ego nke mere ka a chụọ ọtụtụ ndị mmadụ n'ọrụ.
O kwukwara na akụkọ na-ekwu na esemokwu dị n'etiti Osinbajo na Buhari bụ okpokoro asị.
Shehu kwuru na "Buhari na Osinbajo dị na mma nke ọma."
Cheta na ọnụ na-ekwuru Osinbajọ bụ Laolu Akande gọrọ agọ na onweghị onye enyemaka ọbụla a chụrụ n'ọrụ.
Mana ugbua Shehu kweterela na a chụrụ ndị mmadụ, Akande ekwubeghị ihe ọbụla.
Ọkụ agbapịala ahịa ọgbọ osisi n'Ebute Meta na Legọs
Ebe ọkụ a gbara bụ n'ahịa ndị ọgbọ osisi n'Ebute Meta; ebe a na-akpọ Okobaba, na Legọs, n'agbanyeghị na o nweghị onye nwụrụ, ndị hụrụ ihe mere sị na ndị ọrụ gbatagbata abịaghị n'oge.
Ọkụ ọzọ agbala n'ahịa Legọs
Ndịagha na ndị uweojii awuchiela n'ahia Ketu n'ụbọchị Fraide dịka ọgbaaghara daara.
Ozi na-erute anyị na-ekwu na ndị omekome jiri iwe gaa ụlọ ndị uweojii were mebie ụgbọala nọ ebe ahụ.
Ụfọdụ mmadụ sịkwa na otu onye anwụọla n'ihi mgbọegbe tụrụ ya.
Dịka ọ dị ugbu a, onwebeghi onye ma ihe butere ọgbaaghara a.
Otu ụgbọelu atụgharịala maka anwụrụ 'incense'
Aka ndị uweojii akparala otu nwaada bara ụlọmposi n'ime ụgbọelu mụnye 'incense' ọkụ mere ka anwụrụ okụ pụtawa.
Dịka akụkọ si kwuo, nwaada a mụnyere ọkụ tupu ụgbọelu ahụ na-aga Abuja efelie.
Ndị ọrụ ụgbọelụ ahụ nwara ike ha ịkwụsị ya bụ anwụrụ ọkụ mana o nweghi isi, nke mere na ha kwụsịrị njem ha tụgharịa azụ.
Cheta na ụgbọelụ Airpeace tụgharịrị azụ na njem ya dịka ọkwọụgbọelụ chọpụtara na otu injin ya nwere nsogbu n'izu a.
Omole Sowore
Ihe ji nkíta ọnwụ banyere okwu Omoyele Sowore ka jikwa ya.
Ọkaiwu ya bụ Femi Falana sị na ọ ga-alagachị ulọikpe ịgwa ha na ndị ọrụ nchekwa DSS emebeghi ihe a sị ha mee.
Ọ sị na o mechaa nke a, ọ gbaa ha akwụkwọ maka ịgbajọ ihe ụlọikpe kwuru.
Donald Trump
N'Amerịka, ụlọikpe agbaala ama na Donald Trump werela ego e doweere ndị onweghị etu ọha ha, ji zọọ ọchịchị.
Nke a pụtara ihe mgbe Ọkaikpe bụ Saliann Scarpulla nyere iwu ka Donald Trump nyeghachi ha nde dọla abụo maka iti aka n'obi.
Trump si kwanụ na ọ bụ asị o! Mana sịkwa na obi dị ya ụtọ inye ha ego a asị ya nye.
"Jack, ị ga-eri osikapa Jollof?"
Onyeisi ụlọọrụ Twitter bụ Jack Dorsey tụrụ ụkwụ na Naịjirịa n'abalị Tọzde.
Jack dị ka esi mara ya na-eme njem nleta na mba Afrịka ndị ọzọ gụnyere Ethiopia, Ghana na Saụt Afrịka iji zute ndị ji teknụzụ achụ nta ego.
Ndị mmadụ na Twitter na-ajukwa ya ma ọ ga-erị osikapa Jollof Naịjirịa
Idemmiri na-abịa - SEMA
Ndị ọrụ gbatagbata n'Anambra steeti adọọla ndị bi n'ikpere mmiri aka na ntị maka osimiri Niger.
Ha si ha gbagawa n'ogige gọọmentị hibere maka ndị ide mmeri metụtara n'ihi na mmiri nwereike ịgbali elu n'ime otu izuụka.
Manchester United etetala n'ụra?
Ekwensụ ọbara ọbara emeela ihe eji mara n'abalị tọzde mgbe ha banyere agba ọhụrụ n'asọmpị Europa League.
Ha ji ọkpụ goolu atọ asataghị otu merie otu Partizan Belgrade mgbe ha zutere onwe ha.