You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Sanwo-Olu abụghị onye mbụ gbajọrọ ịza 'His Excellency'
'His Excellency' na 'Mr Governor' na-ewu ugbua na soshal midia n'ihi okwu Gọvanọ Legọs bụ Babajide Sanwo-Olu kwuru.
Sanwo - Olu kwuru na ọ ga na-aza "Mr Governor" kama "His Excellency" iji gosi obi umeala na ijere ndị Legos ozi dịka ọ kwesiri.
O kọwara na "His Excellency" na-eme ka onye nọ n'ọchịchị na-ebuli onwe ya karịa ọkwa ya.
N'agbanyeghi ihe a o mere, ndị mmadụ si n'ụzọ di icheiche nabata ya.
Etu ndị mmadụ si nabata mgbanwe aha a
Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Cheta Nwanze kwuru ka Sanwo-Olu chee ihe chere ya n'ihu.
"Ihe Sanwo Olu mere bụ ihe Bekee kpọrọ "soft sell", ihe dị mkpa bụ ịrụ ọrụ, ọ bụghị aha".
Ndị ọzọ kwenyere n'ihe Cheta kwuru bụ Captain Obvious si ya tinye anya n'ọchịchị bụ ihe dị mkpa.
N'aka nke ọzọ onye dịka Mazi Waltz na-ekwu ka gọvanọ steeti ndị ọzọ nyomie ya.
Gọvanọ ndị ọzọ gbahapụrụ echichi "Your Excellency"
- Aka chiburu Niger state n'afọ 2007 bụ Muazu Bbangida Aliyu kwuru ka a kpọọ ya "The Chief Servant" mgbe e duchara ya n'iyi ọrụ
- N'afọ 2015, aka chiburu Oyo steeti bụ Abiola Ajimobi kwuru ka akpọọ ya "Abiola Ajimobi" sọsọ.
- Ebe ọgbọ ya bụ Rauf Aregbesola kwuru ka a kpọọ ndị Gọvanọ "Mr Governor" kama His Excellency.