Innoson Motors: Etu m si lafere n'aka ndị bịara igbu m - Ọkaiwu ya

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Igbo na-atụ ilu sị na onye chi ya egbughị, onweghị onye ga-egbu ya.

Etu a ka o si mee na ndụ Mccarthy Mbadugha bụ ọkaiwu Innocent Chukwuma onye nwe Innoson Vehicle Manufacturing.

Ihe merenụ?

Mbadụgha kọọrọ BBC Igbo na ndị ogbu ara ọbara wakporo ya n'ụlọọrụ ya wee kụọ ya ihe tinka kụrụ pan.

O kwuru na ha hapụrụ ya gbalaga oge ha che na ọ nwụọla, mana ọ nwụghị.

Nke a mere n'ọnwa Oktoba afọ gara aga (2018).

Mana ọ bụ abalị abụọ gara aga (ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba 2019) ka akụkọ ahụ malitere iwu na soshal midia.

Ndị mmadụ boro ebubo ma na-ekwu na ọ bụ maka ikpe dị n'etiti Innoson na otu ụlọakụ a ma aha ya kpatara e ji zite ndị bịara igbu Mbadugha.

Ha kwukwara na ọ bụ na nsonso a ka ya bụ ihe mere.

Mana Mbadugha gwara BBC na ya bụ ihe agbaala afọ.

N'okwu ya: "Agara m ụlọọgwụ na Naịjirịa nakwa mba ofesi tupu m nweta onwe m nke ọma."

"Agbakechaala m ugbu a, mana okwu ahụ ka dị n'ụlọikpe."

O kwukwara na ya amaghị ndị zitere ndị bịara ije ọjọọ ahụ.

Aka enwe chọrọ ịghọ aka mmadụ

Mbadugha kwuru na mgbe ya bụ ihe mere ọhụrụ, ndị uweojii buuru okwu ahụ n'isi ma tukpo ya asị.

Ọ sị na ndị uweojii gara gwa ndị ntaakụkọ na ọ bụ ndịọrụ ya o ji ụgwọ bịara wakpoo ya ma chọọ ịkụgbu ya.

Mbadugha kwuru na nke ahụ mere o ji bido rọwa anya ma o nwere ihe ndị uweojii chọrọ izo.

O kwuru sị: "A nwụchiri ụfọdụ ndị ahụ bịara wakpo m, mana onweghi mgbe ha ji kwuo na ha bụ ndị ọrụ m."

"Onyezi gwara ndị uweojii na ọ bụ ndị ọrụ m wakporo m?"

"Ewepụla m okwu ahụ na nke onyeisi ndị uweojii ka o tinye ya ọnụ."

"Edekwaala m akwụkwọ degara ndị ọrụ ntaakụkọ ahụ dere ya bụ akụkọ."

"Ha ga-edegharị ya ma kwuo nke bụ eziokwu, ma rịọkwaa m mgbaghara."

"Emeghị otu a, m ga-akpọpụ ha ụlọikpe ka ha gaa zara ọnụ ha."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: