USSD meaning: Gọọmentị agwala MTN na ndị ọzọ kwụsị ịna ego maka USSD

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Dkt Isa Ali Pantami enyela iwu ka MTN gbaa "brake" n'ịnapụ ndị mmadụ naịra anọ n'elu USSD.

O kwuru na ọ maghị maka ozi a, nke mere na ọ gaghị aga n'ihu maọbụghị ma o doro ya anya bụ ihe ha na-eme.

Nke a mere ka o zigara ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasaozi na Naịjirịa bụ 'Nigerian Communications Commission (NCC)' ozi, ka ha kwụsị atụmatụ a ruo mgbe ha tulechara ya.

Nke a na-abịa dịka ndị MTN zipuru ndị mmadụ ozi sị na "bido ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba, anyị ga-amalite ịna naịra anọ kwa nkeji 20 ị nwara iji USSD gị".

MTN kwuburu na ndị ụlọakụ ga-akọwara ndị mmadụ maka atụmatụ a dịka ụbọchị na-aga.

Gịnị bụkwanụ USSD a?

Dịka Bekee si kwuo, "Unstructured Supplementary Service Data (USSD)" bụ ihe ndị mgbasaozi ekwentị na-eji ekesa ozi (text message) n'etiti ekwentị na ihe Bekee kpọrọ 'Application' maọbụ App n'ịchafụ.

Ọmụmaatụ etu USSD si arụ ọrụ bụ etu a ụlọakụ GTB nwere *737# ị ga-ejinwu kwụọ ụgwọ maọbụ zụọ ihe na-efu.

Mana atụmatụ ndị MTN wepụtara bụ nke a gọọmentị machiri, bụ na a ga-ana gị ego iji mee ya bụ ihe ego ị chọrọ ime na-ejighi App ndị ụlọakụ gị.

Ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka ya

@MistaChika sị na ịgbanarị ya bụ ụgwọ USSD, na ọ kaara gị mma na i ji App gị na-akwụ ụgwọ ihe ọbụla.

@_extreme kọwara na ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na ị nweghi "data" ị gaghị ejinwu ekwentị gị azụ ihe ọbụla dịka ego e ji akpọ n'ekwentị.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: