'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado Agha Biafra'
Ụmụnne Dick Tiger kwuru maka mbọ ọ gbara were pụta ihe dịka dike na dimkpa, nakwa ka o si nye aka n'agha Biafra.
Ha kwuru na ya bụ nwaamadị tara ahụhụ nke ukwuu tupu ọ pụta dịka dike na dimkpa Igbo.
O rere ololo mkpọ (karama) n'Aba tupu ọ malite ịkụ ịgbakwụ.
Mgbe o merichara ọkpọ na Naịjria, ọ gara Briten ichere ndị ọcha aka mgba.
Ọ dịghịrị ya mfe mgbe o ruru ebe ahụ.
O mechara nwee obi ịdamba tupu Chi Igbo agbakwute ya.
Mgbe ahụ ka ọ malitere ịkụpụ ndị ọcha mkpụru ọkwụru n'anya.
Lee akụkọ a ka ị hụ ka o si gaa.
Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke, Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo