King Jaja of Opobo: Ndị ntọ tọọrọ ya mgbe ọ gbara afọ 12
BBC Igbo gara Amaigbo ijupụta ụmụnne nwafọ Igbo a ama dịka King Jaja nke Opobo ka ha sị mata na ha na nwa amadị a bụ Nwanne.
Ọ rụọla agbụru atọ kemgbe Mbanaso bụ onye amaara dịka Jugbo Jugbo n'Opobo furu.
Bekee tụgharịri ya bụ aha kpọwazịa ya Jaja maka na ha enweghị ike ịkpọli Jugbo Jugbo.
BBC Igbo na nwa nwanne Jaja bụ Duruoshiri nke abụọ nwere mkparịta ụka na nchete nwaanne ha bụ Mbanaso.
Duruoshimiri tọturu anyị abọ ka Nna ya siri kọwaara ha maka Mbanaso na ka esi tọrọ ya, nakwa ka ha sị mata na ọ ka dị ndụ.
Ọrụ a sị n'aka Chris Sanctus Okereke.