You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Enugu Airport Closure: Amapụtala m ijeri naịra 10 maka ịrụzi ọdọụgbọelu Enugwu - Buhari
Akụkọ dị mkpa
Amapụtala ijeri naịra 10 maka ịrụzi ọdọụgbọelu Enugwu - Buhari
Onyeisiala Muhammadu ekwuola na ọmapụtala ego dị ijeri naịra iri maka ịrụzi ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.
O kwuru na o mere nke na-agbanyeghi ụkọ ego dị n'iji arụpụtala ihe dị iche iche chere gọọmentị n'ihu.
Onyeisiala Buhari sị na dịka ọ bụ ọrụ dịrị gọọmentị ya ịrụ akụrụngwa dị n'obodo na ọ bụ nke a.
O kwuru na minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekweela ya ngwa na a ga-arụcha ọdọụgbọelua n'oge na-adịghị anya.
Cheta na o ruola ihe dịka izuụka itoolu gọọmentị mechiri ọdọụgbọelu ma kwuo na a chọrọ ịrụzi ya.
A ga-ebelata ego ndị ụlọọrụ gọọmentị ji eme njem
Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ka ebelata ego ndị ọrụ gọomentị gbalitere n'ọkwa.
Site ụgbụa gawa n'ihu,
1) Nanị ụbọchị onye ọrụ a kwesịri i nọ maka nzụklo ọbụla ka gọọmenti ga akwụ ụgwọ ya.
2) Onye ọbụla na-aga nkem ga egosi akwụkwo na-egosi ihe kpatara o ji eme njem.
3) Ọ bụ nanị njem gbasara gọomenti ka a ga agwụ ụgwọ ya.
4) Mmadụ anọ nani ga eso ndị minista eme njem nke ga agunye 'Director', 'Schedule Officer' na onye enyemaka Minista. Ndị minista ka n'ọkwa bụ mmadu atọ.
5) Onyeisiala kwuru na ọ bụ nani ụgboro asatọ ka gọomentị ga-akwụ ụgwọ njem n'afo. kama,ndị minista, 'Permanent Secretary', onyeisioche ndị 'Extra-Minsterial Departments', 'Chief executive officers' na ndị 'Director'.
Ndịagha Naịjirịa esila n'ịgba Egwueke banye Atilogwọ Udo
Ndịagha Naịjirịa sị na emume 'EGWUEKE' ha na-eme n'ọwụwanywnụ Naịjirịa ga na-aza zi 'ATỊLỌGWEỤ UDO'.
Ozi a dị n'akwụkwọ ozi si n'akara Twitter ha bụ nke onye nghazi mgbasaozi ha bụ Aminu Iliyasu tinyere aka na ya.
Emume a dịka ha si kwuo bụ nke ha na-eji azụ ndịagha n'ụzọ dị iche iche malitere n'afọ 2016.
Ndịagha sị ha na-ejikwa emume a ememina mpụ ndị dịka ohi, ntọrị mmadụ, agha ndị otu nzuzo, esemokwu dị n'etiti obodo nakwa ndị ọzọ.
Ha kwukwara na mgbanwe aha emume apụtaghị na usoro e ji eme ya agbanwela, na usoro niile ha ji eme ya ka kwụ etu ọ dị na mmalite.
Cheta na ọ bụ n'oge emume 'EGWUEKE' nke afọ 2017 ka ndịagha wakporo ụlọ onyendu Ipob bụ Nnamdị Kanu dị n'Afara Ukwu Ibeku Umuahia nke Abia Steeti.
Boris Johnson sị na Briten na UK enweela nkwekọrịta
Otu 'European Union' na mba Briten enweela nkwekọrịta maka etu Briten ga-esi hapu EU dịka Praịm Mịnịsta Briten bụ Boris Johnson sị kwuo.
Ha nwere mkparịtaụka a n'Obodo Brussels nke dị na mba Belgium.
Johnson kwuru na "anyị enwetela ezigbo nkwekọrịta ga-enye anyị nnwereonwe".
Ọ teela ndị isi mba abụọ a ji enwe mkparịtaụka maka ọdịmma onwe ha ma ọ bụru na Briten hapụ EU, mana nkwekọrịta a ha nwere ka ga-aga n'ihu ndị omeiwu mba Briten nakwa nke ndị EU iji binye ya aka.
Mana ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị a kpọrọ 'Democratic Unionist Party' (DUP) ka na-ekwusi ike na ha akwadoghi nkwekọrịta a.
Ndị pati a bụ nke ndị Northern Irish ekwubụọla na ha agaghị atụkwasi obi n'okwu Johnson.
Onyeisi ndị anọghị n'ọchịchị bụ Jeremy Corbyn boro aka n'isi tie mkpu sị na mkpebi a Johnson na aṅụrịrị kakwa njọ karịa nke Theresa May nwetere.
Corbyn kpọkuru ndị otu ya ka ha ghara ịge Johnson nti n'ihi na okwu ya bụ okwu onye awụrụaka.
N'aka ọzọ onyeisi European Commission bụ Jean-Claude Juncker sị na ya bụ mkpebi dị mma n'ụzọ ga-abara mba abụọ ahụ uru.
Aisha Buhari na ndị enyemaka ọhụrụ
Ị nụrụ na nwunye onyeisiala bụ Aisha Buharị enweela ndị enyemaka mmadụ isii ọhụrụ.
A nụrụ na ndị a gụnyere Mairo Almakura, Muhammed Albishir na Wole Aboderin.
Ndị ọzọ bụ Aiyu Abdullahi, Zainab Kazeem na Funke Adesiyan.
Aisha ji ohere a arịọ mgbaghara maka ya bụ ihe onyonyo pụtara na sochịal midia ebe ọ na-abamba.
Trump ekweghị ojiji
Akọgbuola onyeisiala Trump n'ọnụ maka mkpọpụ ọ kpọpụrụ ndịagha Amerịka na Syria.
Trump n'onwe ya achọkwaranụ ịma, ebe ọ na-ekwu na Amerịka abụghị ndị uweojii mbaụwa.
A na-eche na ọ bụ maka ọpụpụ a Amerika pụrụ mere ndị Turkey ji malite ibuso ndị Kurd agha ọzọ.
Egwu a chaala Pogba
Kedu ka ị sị hụ ọnọdọ Manchester United n'Asọmpi ha na Liverpool na-aga ịgba?
Onwebeghi onye ma ebe ha bụ asụrụ asụ dewere ọdụ ebe a sị na Paul Pogba agaghị esokwa gba ya bụ bọọlụ.
Anyị nụrụ na Pogba merụrụ ahụ dịka ojisiaghọ mgbo ha bụ de Gea.