Press Freedom: 'Ndị nchekwa ejichiela ndị ntaakụkọ 19 n'afo a' - Amnesty International

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị onye bụ Amnesty International ekwuola na ha achọpụtala na ndị nchekwa Naijirịa na-emegide ndị ntaakụkọ, ọkachasị ndị na-akatọ atụmatụ gọọmentị.

Ndị ngalaba a na-ekwukwa na ndị nchekwa Naijiria akpọchiela ihe ruru ndị ntaakụkọ iri na itolu kamgbe afọ 2019 bidoro.

N'ime akwụkwọ nyocha ha depụtara ka ụfọdụ ndị ntaakụkọ kwuru na ndị nchekwa tiri ha ihe ma taa ha ahụhụ mgbe ha nwụchiri ha.

Ngalaba a na-ahụ maka ikike dịirị onye tụru ndị uweojii, ndịagha na ndị ọrụ ncekwa nzuzo bụ 'Department of State service' (DSS) aka dịka ndi kacha awakpo ndị ntaakụkọ.

Ha kwuru maka Jones Abiri nke ụlọorụ ntaakụkọ 'Weekly Source Magazine' ndị DSS nwụchiri n'afọ 2016, ma jide ya afọ abụọ nọrọ n'elu ya, ha ekweghị ka ya na ndị ezinụlọ ya nwee mmekọ ọbụla.

'Amnesty International' (AI) kwuru na ndị DSS nwuchikwara Abiri ọzọkwa na nsonso a maka ebubo na-erijughị afọ.

Ha kwukwara na ndị nchekwa wakporo ụlọorụ ndị mgbasaozi nke 'Daily Trust' maka akụko ha depụtara maka mkpamkpa ndị Boko Haram na-akpa na mpaghara ugwu.

I jị maa atụ, AI kwuru maka onye ntaakụko aha ya bụ Dadiyata a biara tọro n'ihu ezinaụlọ ya.

Dịka ọ dị ugbiua, a na-ebo ndị nchekwa Naijiria ebubo imegide iwu gbasara ikike diri onye.

Kama ndị nchekwa Naijirịa na agọ ukwu na aka ha maka ebubo a.

N'aka nke ọzọ, ndị ngalaba ahụ na-ahụ maka ikike diiri onwe ebidola atụmatụ ha kporo "Freedom of Expression Brief" n'ụbọchị 14 nke Oktoba 2019.

Ebe a ka ha ka esi na-egosipụta mkpagbụ a na-akpagbu ndị ntaakụko na Naijiria.

Akụk ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị