You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ebonyi Airport Project: E nyela Ebonyi Steeti ikike ịrụ ọdọụgbọelu nke ha
Mịnịsta na-ahụ maka ụgbọelu bụ Hadi Sirika enyela gọvanọ Dave Umahi ikike ihiwe ọdọụgbọelu na Steeti ahụ nke ọ rịọrọ ka e nye ya.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi Hadi Sirika degaara gọvanọ Umahi nke direktọ 'Safety and Technical policy' bụ TA Alkali tinyere aka na ya.
Mịnịsta sị na ikike a na-abịa dịka ha nyochara ebe ọdọụgbọelu ahụ ga-adị ma chọpụta na ọ dị mma, na gọọmentị Ebonyi Steeti mezuru ihe ndị a sịrị ha mee.
Onye odeakwụkwọ mgbasa ozi Gọvanọ Ebonyi bụ Emma Uzo sị na ọdọụgbọelu a ga-akwụrụchịm n'ime otu afọ na ọnwa anọ na-abịa abịa.
Ọdọụgbọelu a ga-adị na mpaghara etiti okpuruọchịchị ukwu na ndịda Ezza dị n'Ebonyi Steeti.
Ụmụ Naịjirịa ruru 220 edebanyela aha i si Saụt Afrịka alọta
Eze Ali Ndubuisi Udeji bụ Onowu ndị Igbo na Saụt Afrịka ekwuola na ndị Naịjirịa mmadụ 220 edebala aha na ndị ga-aso lọta na Naịjirịa.
O kwuru nke a na mkparịta Facebook Live ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị 7 Seputemba, afọ 2019.
Udeji sị na ọ bụ ndị isi ụlọọrụ Naịjirịa na Saụt Afrịka na-ahazi etu ndị mmadụ ga-esi debanye ha maka ịlọta.
Ọ gara n'ihu kwuo na idebanye aha a bụ n'efu na onweghi ụgwọ a na-akwụ tupu e mee nke a, na ndị mmadụ ka na-edebanye aha ugbua.
Udeji sị na ụgbọelu Air Peace ga-ebu ha kwesiri ifepu taa mana ọ ga-abụ zi na Wednezde 11, Seputemba, iji nye ohere ka ndị mmadụ debanye aha.
Cheta na ụlọọrụ ụgbọelu Air Peace kwere nkwa izipu ụgbọelu ga-aga mba Saụt Afrịka bulata ụmụ Naịjirịa.
N'ofesi
Mba Rọshịa na Yukren agbanwerịtala ndị atụrụ mkpọrọ n'etiti ha abụọ bụ nke a tụrụ anya ime n'ọtụtụ oge
Ndị a gbanwere gụnyere ndị ọkwa ụgbọmmiri mba Yukren nakwa otu onye a sị gbaturu ụgbọelu gburu mmadụ narị abụọ na iri itoolu na asatọ.
N'egwuregwu
Nwafọ mba Kameruun na-agba bọọlụ bụ Samuel Eto awụsala ọwa n'ịgba bọọlụ.
Eto'o gbaara otu Barcelona, Inter Milan na Galataxsary bọọlụ.
Nkeji
Ihe nkiri
Onye ọkụchukwu a nwụchiri
Ndị uweojii anwụchiela mmadụ ise aka ha dị n'ọnwụ otu nwoke akpọrọ Princewill Ezeji n'Imo steeti.
Ha kwuru na nwoke ahụ furu efu mgbe ọ gara ịgosi onye amụma ya bụ Mbonu Michael ụgbọala ọhụrụ ọ zụtara tupu ezinaụlọ ya ebido ịchọ ya.
Nwanne ya nwoke gara na nke ndị uweojii ndị malitere nyocha butere nwụchi mmadụ ise a.
Ha gụnyere Mbonu Michael, Nwogu Anselm, Blessing Miachael, Chidinma Godwin, Kingsley Udemba.
Na mba ofesi
Nari kwuru nari mmadụ agbaala ọsọ ndụ ha na mnba Bahamas dịka oke ifufe mmiri Dorian mebiri ihe na mpaghara ahụ
Na ngụkọ ikpeazụ emere, ndụ mmadụ iri anọ na atọ efuola na ya bụ ọdachi bidoro kemgbe etiti izuụka a
N'egwuregwu,
Rafael Nadal akụpụla Matteo Berettini ọkwụrụ n'anya mgbe ha zutere onwe ha na asọmpị US Open.
Nke a pụtara na Nadal anaferela n'agba ikpeazụ ebe ọ ga-ezute Danil Medvedev nke mba Rọshịa.