You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
American Visa Fee: Anyị agaghị ewepu ego anyị tụkwasịrị n'ego visa - America
Ozi si n'ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka na Naịjirịa bụ nke Bekee kpọrọ "US Embassy" na-akọwa na ha agaghị eweleta ego ndị si Naịjirịa aga mba ha ga-akwụ iji nwete akwụkwọ ikike ịba be ha.
Ụlọọrụ ahụ sị na agbanyeghi na ha ma amaka mkpebi Naịjirịa iwelata ego ndi Amerịka na-akwụ maka "visa", ha enwetebeghi ozi n'aka ha.
Ha sịkwa na ọ bụ mgbe ha nwetara mkpebi a n'aka gọọmentị Naịjirịa ka ha ga-etinye anya na ego a na-ese okwu.
Ka o dị ugbua, a ka ga na-akwụ ya bụ ego e tinyere.