Living With Deaf Parents: Etu m si too n'aka nne na nna m chiri ntị

Aha onyonyo, Nwata nwoke nne na nna ya bụ ndị ogbu, ji mkpịsị aka ha akparịta ụka.

Nwata nwoke nne na nna ya chiri ntị kọrọ etu o si too.

Ọ kọwaara BBC etu o si malite na nwata bido ime ihe dị icheiche n'onwe ya n'ihi na ọbụghị ihe niile ka nne na nna ya ga-emenwuru ya.

Ọ kọwakwara etu ọtụtụ ndị mmadụ si emere ya ebere mgbe niile, mana nke ahụ anaghị amasị ya.

Nwata nwoke a kwuru na oge ụfọdụ, ọ na-amasịkwa ya ka ya na ndị mụrụ ya were ọnụ kparịta nkata, mana nke ahụ apụghị ime.

N'ikpeazụ, o kwuru na ọ pụtaghị na ụwa agwụla n'ihi na nne na nna ya anaghị anụ ihe. O werela ụwa etu o si hụ ya.

Ihe nkiri ndị ọzọ ga-amasị gị: