Francesca Chiejina: Ịgụ egwu Igbo n'Opera bụ ihe ga-ekwe omume
Francesca Chiejina bụ onye ọgụegwu opera a ma ama na mbaụwa.
O nwetela ọtụtụ nturuugo maka olu egwu ya.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Chiejina kwuru na ọ ga-ekwe omume ịgụ egwu Igbo n' opera.
Mana nwaada a, a mụrụ n'ala Naijiria tupu a kpọpụ ya ala bekee oge ọ dị afọ isii tụrụ arịrị na ya amaghị asụ Igbo.
Ọ sịrị, "Ihe kacha ewute m bụ na amaghị m asụ Igbo."
Ọ gara n'ihu gwa ndị nne na nna ka ha gbaa mbọ na-akụziri ụmụ ha asụsụ Igbo.'
Kirie mkparịtaụka ahụ n'uju.