Francesca Chiejina: Ịgụ egwu Igbo n'Opera bụ ihe ga-ekwe omume

Aha onyonyo, 'Ihe kachi ewute m bụ na amaghị m asụ Igbo'

Francesca Chiejina bụ onye ọgụegwu opera a ma ama na mbaụwa.

O nwetela ọtụtụ nturuugo maka olu egwu ya.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Chiejina kwuru na ọ ga-ekwe omume ịgụ egwu Igbo n' opera.

Mana nwaada a, a mụrụ n'ala Naijiria tupu a kpọpụ ya ala bekee oge ọ dị afọ isii tụrụ arịrị na ya amaghị asụ Igbo.

Ọ sịrị, "Ihe kacha ewute m bụ na amaghị m asụ Igbo."

Ọ gara n'ihu gwa ndị nne na nna ka ha gbaa mbọ na-akụziri ụmụ ha asụsụ Igbo.'

Kirie mkparịtaụka ahụ n'uju.