Nnamdi Kanu: Gwa anyị ebe ndị Gọvanọ gị nọ ma ị chọọ N1m

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Nnamdi Kanu bụ onyendu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) ekwuola na ọ ga-enye onye ọbụla nwetara ozi bara uru gbasara etu aka ya ga-esi kpata ndị ndu ndị Igbo ma ha bịa mba ofesi, otu nde naịra.

O kwuru na ụjọ anaghị atụ ha bụ ndị IPOB ịga ụlọmkpọrọ ma ọ bụrụ ihe ọ ga-eweta.

Nke a pụtara ihe dịka ọ gbasara ozi na mgbede ụbọchị Sunde ebe ọ tinyere ọnụ n'okwu metụtara ihe etiri Ekweremadu na mba Jamini.

N'akụkọ yiri ya, Sinetọ Enyinnaya Abaribe, gọvanọ Delta steeti bụ Ifeanyi Okowa, na ndị isi a hụrụ kwaba okpu ndị ọzọ na Naịjirịa akatọọla ihe e tiri Sinetọ Ike Ekweremadu na mba Jamini ụbọchị abụọ gara aga.

Abaribe kwuru na ọ bụ igosi enweghi obi ekele maka nwoke bu ihe gbasara ịzọtara Igbo ihe ọma ruru ha n'isi, ebe Okowa kwuru ka ndị Naịjirịa nọ ebe ọbụla n'ụwa kwanyere onwe ha ugwu ghara ime ihe ga-emechu mba a aha.

N'ofesi,

Aka akparala James Reardon bụ nwaamadi ndị uweojii obodo Ohio dị na mba Amerịka na-enyocha maka inwe ebumnobi ịgbagbu ndị mmadụ n'otu ụlọekpere ndị Jew.

Ndị uweojii chọtara ọtụtụ ngwaagha ka ha gara tụọ imi n'ala nyochaa ụlọ ya.

N'egwuregwu,

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekeleela otu bọọlụ nkata ụmụnwaanyị Naịjirịa e ji Dtigress mara, ka ha mabutere Iko Mba Afrịka nke ugboro anọ ha.

Dtigress butekwara iko a n'afọ gara aga, meriri mba Sịnịgal, ebe nwaafọ Igbo bụ Ezinne Kalu, nwetara ntuurugo "ọkacha baa uru" n'asọmpi ahụ.

Gere akụkọ BBC n'otu nkeji:

Lere ihe nkiri ga-amasị gị: