Christine Lagarde: Gịnị ka ị kwesịrị ịma maka ya ka ọ na-apụ IMF?

Christine Lagarde

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Christine Lagarde bụ onyeisi IMF

Christine Lagarde ga-akwụsị ịbụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka akụnaụba mbaụwa bụ International Monetary Fund (IMF) n'ụbọchị 12 nke ọnwa September.

Nke a na-abịa dịka o dechara akwụkwọ n'ụbọchị 16 nke Julaị 2019, iji wụsa ọwa sị na ọ naghị arụzị.

N'ime ihe niile a, gịnị ka ị kwesịrị ịma maka ya?

Gịnị ka ị ga-eji cheta ya?

Onye bụ Christine Lagarde?

  • A mụrụ ya na mba Frans n'afọ 1956
  • Ọ gụrụ akwụkwọ n'efu na mba Amerịka n'afọ 1973, ebe ọ nọ mụta ịsụ Bekee
  • Ọ gụrụ akwụkwọ ịbụ ọkaiwu n'obodo Paris dị na Frans wee mechaa rụwa ọrụ dịka ọkaiwu
  • N'afọ 2005, ọ malitere ịrụ ọrụ dịka minista na-ahụ maka azụmahịa nke mba Frans
  • N'afọ 2007, e mere ya minista na-ahụ maka akụnaụba nke mere ka ọ bụrụ nwaanyị mbụ ga-arụ ọrụ ahụ.
  • Ọ malitere ịrụ ọrụ dịka onyeisi ndị IMF n'afọ 2011
  • N'afọ 2010, o mere ka ndị mmadụ jiri anya ọma na-ele IMF maka etu o si nyere ndị mba Gris aka mgbe akụnaụba obodo ha dara mba.
  • O mekwara otu ihe ahụ n'afọ 2018 mgbe akụnaụba obodo Ajentina nọ na-achọ ịda mba, site na inye ha ijeri dọla 57.
  • N'ime afọ 2019, ọ kpọrọ gọọmenti etiti oku ka ha wepụ ego ha na-agbakwunye iji hụ na mmanụ ụgbọala dị ọnụ ala.
  • N'afọ 2019, a họpụtara ya dịka ndị nwere ike ịbụ onyeisi ụlọakụ nke European Central

Ndị nwere ike ịnọchi ya

Etu a ọ pụrụ ugbua, ndị mmadụ ekwuola okwu maka onye e nwere ike ịhọpụta ka ọ nọchie anya ya.

Kedụ ndị nwere ike ịnọchi ya?

David Lipton - Ọ bụ ya ka ndị IMF họpụtara ka a na-arụ ọrụ dịka onye nnochiteanya ruo mgbe a ga-ahọpụta onyeisi ọhụrụ. Ọkwa enwere ike iru ya aka?

Mark Carney - Onyeisi ụlọakụ nke Ịngland rụburu dịka onyeisi ụlọakụ nke mba Kanada

Olli Rehn - Onyeisi ụlọakụ nke Fịnland ọ nọkwa n'oche ndị na-ahụ maka ọdịmma IMF

Kristalina Georgieva - Bụ onyeisi ụlọakụ mbaụwa; ọkwa ọ nọ na ya kemgbe afọ 2017

Lee ihe nkiri a gbasara onye na-ere ahịa mbugharị.

Aha onyonyo, 'Mgbe ihe dị mma anyị na-enweta N2000'