You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Madonna students: Ụmụakwụkwọ 7 mahadum Madonna a nọ mkpọrọ apụtala
Atụghapụla ụmụ Mahadụm Madonna dị n'Okija nọbụ na mkpọrọ
Nwanne otu n'ime ụmụakwụkwọ ahụ agwaala BBC Igbo na ha apụtala.
Sopuru Nnamani sị na nwanne ya bụ Chijioke Nnamani na mmadụ isii ọzọ atụrụ mkpọrọ maka ihe ha dere n'akara soshal midia nwetere ntụghapụ n'aka Ọkaikpe Babatunde Quadri dịka omegharịrị iwu eji jide ha.
Ụmụakwụkwọ a nọ mkpọrọ kemgbe Jenụwarị agbanyeghị na-enyere ha ohere ịla site n'ikpe ekpere na ụbọchị 19 nke ọnwa Maachị.
Ihe ji ha bụbụ na ha enweteghị otu n'ime n'akaebe ha .
Ọ sị na nke dị mkpa maka ezumike ọnwa abụọ ndị ọkaiwu chọrọ ga n'ọnwa na-abịanụ.
Maazị Nnamanị gwara BBC na ha mezuru iwe ụlọikpe sị ha mee n'elekere 6 nke mgbede ụnyaahụ.