RUGA Settlememt: Libya: Gọọmentị etiti akwụsịtụla atụmatụ ya

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ dị mkpa:

Gọọmentị etiti esepụtụla aka naRUGA Settlement

Gọọmentị etiti ekwuola na ha esepụtụla aka n'atụmatụ ịzụ ehi a kpọrọ RUGA Settlement rue oge a na-amaghị mgbe ọ bụ.

Naịjirịa ga-ebinyeaka na nkwekọrịta azụmahịa n'Afrịka

Onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buhari ekwuola na ọ ga-ebinyeaka na nkwekọrịta azụmahịa n'Afrịka nke bụ 'Africa Free Trade Agreement' na Bekee, mgbe ha ga-agbakọ Afrịka Yuniọn na Niger.

N'ozi si n'igwe twitter ya, Buhari sị na o kwetara nke a ka o soro ndị ma maka ya kpaa izu.

A ga-echeta na Naịjirịa ekweteghi ibinyeaka na nkwekọrịta azụmahịa n'Afrịka nke bụ 'Africa Free Trade Agreement' na Bekee maka na ọ na-atulee uru nkwekọrịta a barala akụnaụba Naịjirịa.

Ndị isi Afrịka ga-ezukọ n'izu a n'obodo Niamey.

Ozi si n'akara Twitter onye enyemaka onyeisiala Buhari bụ Bashir Ahmad kwuru na e mere nke a site na mkparịta osote onyeisiala Yemi Osinbajo na ndị gọvanọ ndị ọzọ nwere ta.

Mana nke a ebutela oke okwu n'etiti ụmụ Naịjirịa, ụfọdụ na asị na nkwụsịtụ a dị mma ebe ndị ọzọ sị na ka gọọmentị kagbuo ya kpamkpam.

@realFFK sị ka a kagbuo karịa ịkwụsịtụ ya:

@renoomokrị kere Buhari maka ige ndị mmadụ ntị:

Atiku: Agwa Elisha Abbo dị obimwute, o nweghị ebe mgbado ụkwụ

Onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019 bụ Atiku Abubakar adụọla Senetọ Elisha Abbo ọdụ ka ọ rịọ mgbaghara ma nyefee onwe ya ndị uweojii maka ị ma nwaanyị ụra.

Atiku onye kwupụtara nke a n'igwe okwu Twitter ya ụbọchị Wenezde si na ihe onyonyo ahụ dị " obi mwute, o nweghị ebe mgbado ụkwụ"

Ọ gara n'ihu kpọkuo otu PDP ka ha lebanye anya n'agwa Abbo kpasara nwaanyị.

Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia ụbọchị Tuuzde gosiri ebe Senetọ Elisha Abbo mara nwaanyị ụra chara ọkụ n'ọdọahịa. a na-ere ihe egwuregwu ndị okenye.

Ogbunigwe agbagbuola mmadu ruru 40 na Libya

Mmadụ iri anọ anwụọla ebe mmadụ iri asatọ merụrụ ahụ n'obodo Tripoli Libya mgbe ogbunigwe dakwasịrị ụlọ ebe ndị mbịarambịara bi.

Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị nwụrụ n'ihe a bụ ndị mbịara mbịara si mba Afrịka.

"Ndị Dọkịta Anambra nwee ndidi"

Gọọmentị Anambara steeti ekwetala na ụgwọ a na-akwụ ndị dọkịta ezighi ezi mana ha sị ha nwee ndidi

Nke a sị n'ọnụ Don Adinuba bụ kọmishọna mgbasaozi na-abịa dịka ndị Dọkịta gbara abụbọ ọrụ n'Anambra kemgbe izuụka asaa gara aga.

Wole Soyinka kwuru na RUGA bụ ihe nwereike ịmee ka Naịjirịa nwuru ọkụ ma akpachaghị anya.

Soyinka kwuru nke a mgbe a jụrụ ya ajụjụ gbasara RUGA gọọmentị chọrọ ịwepụta.

O kwuru na Ranching ka mma karịa RUGA ma kwuo na ekwesiri ime ya ebe ọ gaghị enye ndị mmadụ nsogbu.

N'egwuregwu,

Otu bọọlụ Amerịka agbapụla otu England n'agba ịkpeazụ nke asọmpi Iko mbaụwa ụmụnwaanyị

Nke apụtara na ha na mba Sweden maọbụ Netherlands ga-azọ ọkwa onye atọ na ngwụcha asọmpị ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị: