You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Adewura Bello: Etu ololu 'si loo' nwa agbọghọ na Lagos
Ka ezinaụlọ Adewura Bello na-agba mbọ ịchọta ya site n'ụbọchị nke iri na ise nke ọnwa Mee, ha amaghị na ọ fọrọ nwantakịrị ka ọ laruo tupu ọdachị adakwasị ya.
Ụnyaahụ bụ ụbọchị 26 nke ọnwa Mee ka ozi pụtara na soshal midia na a hụla ozu ya bụ nwa ada.
Akụkọ so ya bụ na ọ dabara n'ọwa mmiri ka nnukwu mmiri zochara ụbọchị ahụ, e wee gụpụta ozu ya ebe tere ezigbote aka ka o mere abalị iri na otu e bidoro chọwa ya.
Otu onye sị na ọ bụ nwanne ya nwoke, dere na Twitter na obi na-amapụ ya mgbe ọbụla ọ hụrụ na a ka na-achọ ya achọ:
Onye ọzọ sịkwa na ọ bụ nwanne ya dere na a hụla ozu ya.
Akụkọ etu nke a si mee gbagwojuru anya nke mere BBC Igbo ji gaa ime nchọpụta nke bụ eziokwu, wee hụta ebe ya bụ ihe mere ma gbakwa ndị hụrụ mgbe o mere, ajụjụ ọnụ.
Ihe anya hụrụ kwuru
Otu nwoke achọghị ka e dee maọbụ kwuo aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ ọgbatumtum bu onye o che na ọ bụ Nwaada Bello na ala be ha danyere n'ime idemmiri.
Ka ha si kọwa, onye ọgbatumtum pụtara mana dịka mmiri ahụ ji ike aga, o buru nwat nwaanyị banye n'ime ihe Bekee kpọrọ 'sewage'.
Ndị bi nso n'ebe ihe a mere si na o teela ihe Bekee kpọrọ 'manhole' n'etiti ahụ mebiri, "mana gọọmentị achọghị imezi ya".
Ugbua, otu onye o metụrụ n'obi ewerela igwe gbachite oghere 'manhole' ahụ, maka igbochi ọdachị ọzọ.
BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legos steeti bụ Bala Elkana maka okwu a.
Maazị Elkana kwenyere na o nwere ozu a hụrụ n'ime awa mmiri, mana ọ gara n'ihu kwuo na amabeghị ma ọ bu nwaada ahụ a na-achọ.
Agbanyeghị nke a, ozi ruru BBC Igbo ntị bụ na e liliela Adewura Bello.
Mbọ BBC gbara inweta ndị nwe ya amịtaghị mkpụrụ makana a sị na ha achọbeghị ka ndị ntaakụkọ ruo nso.
Otu onye achọghị ka e kwuo aha ya gwara anyị na o so gaa ya bu olili.
Kedụ ihe bụ 'manhole'?
Mgbe gọọmentị hibere Gowon Estate na ụfọdụ ebe a rụrụ ụlo maka obibi ndị mmadụ (Festac na Jakande estate sokwa) n'afọ 1976, ha rụrụ ya ka ọwa mmiri nakwa ebe nsị ga-esi pụọ, dị n'ime ala.
Bekee na-akpo ụdịrị ọwa mmiri a 'Sewage System'. Na Festac, ọwa mmiri a na-ebuga nsị ebe akpọrọ 'Sewage Treatment Plant' ebe a ga-awa ya hụ na ihe nwereike inye mmadụ ọrịa adịghị na ya tupu ahapụ mmiri a ka ọ banye osimiri.
Ihe Bekee na-akpọ 'manhole bụ oghere e nyere ha ndị ọrụ si na-aba ime ọwa mmiri ma e nwee mgbochi maọbụ a chọọ ka a rụọ ọrụ ebe ahụ.
Ebe onye eche na ọ bụ Nwaada Adewura Bello danyere bụ otu n'ime manhole a dakasịchara.