You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chimamanda Adichie vs Akwaeke Emezi: Ihe mere e ji kpụrụ ha n'ọnụ na soshal midia
Ụmụada Igbo abụọ na-ede akwụkwọ bụ Chimamanda Adichie na Akwaeke Emezi na-ewu na sohal midia maka ihe ha dere.
Ọtụtụ ndị na-ekwu na mmadụ abụọ a na-adụ onwe ha aka n'ọnụ site n'ozi ha wepụtara na soshal midia.
Ihe Chimamada deere
Chimamanda dere akụkwọ ọ kpọrọ "It is Obscene" nke pụtara omume rụrụ arụ bụ ebe ọ kọwara ihe ọ na-agabiga dịka onye a ma ama.
Ozi a bụ nke ọ dere maka mmadụ abụọ ọ na-akpọghị aha kọwaara etu o si nyere ndị ahụ aka mana ha mechara bịa na-akparị ya na soshal midia maka ihe o kwuru n'ajụjụ ọnụ ọ zara n'afọ 2017.
Ọ sị na ndị a maara ya nke ọma na ọ na-akwado mgbanwe ụdịdị onwe ha a kpọrọ 'Transgender'. Ọ sị na ihe ndị gaara eme bụ ịkpọ ya n'ekwentị maọbụ dere akwụkwọ banyere ya kama ha apụta na soshal midia na-akparị ya.
Ihe Emezi deere
Adichie akpọghị onye ọbụla aha mana Akwaeke Emezi na nzaghachị sị na Adichie anaghị ha ikike tupu o bipụta mkparịtaụka na email n'ime akwụkwọ ahụ o dere.
Ọ sị na ọ gaghị agụ akwụkwọ ahụ Adichie dere ma kọwaa ya dịka onye ọjọọ kpọrọ ndị 'Transgender' asị.
Onye bụ Akwaeze Emezi?
Akwaeke Emezi bụ nwaafọ Igbo emetela ihe ndị mmadụ ji kpụrụ ya n'ọnụ na mbaụwa.
Ị na-ajụ ihe o mere? BBC Igbo ga-aza gị.
Emezi sị na ọ bụ "Ndị" (n'ihi na ọ bụghị nwoke maọbụ nwaanyị) toro n'Aba dị n'Abịa steeti, dere akwụkwọ ndị bekee chọrọ iji mee ihe ejije bụ nke a na-akpọ "film" na bekee.
O biputara ya bụ akwụkwọ wuru ewu, nke a kpọrọ "fresh water" n'afọ 2018; otu afọ ka o nwetachara nturuugo n'asọmpi edemede nke Common Wealth e mere n'afọ 2017.
Iji gosi gị na Igbo nwere mmadụ, Emezi sozi ndị odeakwụkwọ e ji ama atụ dịka Flora Nwapa, Chimamanda Adichie, Buchi Emecheta wdgz.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma maka ya:
- O toro n'Aba n'agbanyeghi na a mụrụ ya n'afọ 1987 n'Ụmụahia.
- Nna ya bụ onye Igbo ebe nne ya bụ onye Tamil, na mba Maleshia.
- O nwetere asambodo "International Politics and Nonprofit management" na mahadum New York n'afo 2012, ma gụkwaa "Creative writing" site n'afọ 2014 ruo 2016, na mahadum Syracuse dịkwa na New York.
- Emezi na-akpọ onwe ya ma na-ekwu na ọ bụ ọgbanje.
- O wepụrụ akpanwa ya n'ihi na o kwetere na ọ bụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị.
- O kwenyekwara na ọ na-anụ olu atọ dị iche iche na-agwa ya okwu.
Akụkọ ga-amasị gị: