You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Building collapse: Ụlọ elu adagbuola Injinịa na-arụ ya n'Ọnịcha
Ụlọ elu ogogo atọ dị n'okporoụzọ Ezenwa adagbuola onye Injinịa na-arụ ya n'Ọnịcha nke Anambra Steeti.
Mana akụkọ na-ekwu na ọ dịka onye Injinịa a nwụrụ mgbe igwa katapilla na-egwupụta ya dọkara otu ụkwụ ya.
Ụlọ elu a bụ nke a sị na a na-arụ ọhụrụ dara n'ehihie a mgbe onye Inginịa na-ahụ maka ụlọ ahụ bịara ịma ka ọrụ si aga n'ebe ahụ.
N'erughi nkeji iri ọ bịara ebe ahụ dịka anya hụrụ ya si kwuo na ụlọ a dara ma dakwasị n'elu onye Inginịa ahụ na ndị ọzọ na-arụ ụlọ ebe ahụ.
Anya hụrụ ka ihe ji eme kwuru na ndị ọrụ nchekwa nọ n'ebe ahụ.
Dịka ọ dị ugbua, a kpọpụtala mmadụ ise n'ime mmadụ asaa nọ n'ime ụlọ ahụ, mmadụ anọ ka dị ndụ ebe otu onye bụ Injinịa anwụọla mana ọ fọrọ mmadụ abụọ.
Ndị a akpọpụtara ka dị ndụ dịka eburula ha gawa ụlọọgwụ maka ịnata ọgwụgwọ.
Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ndị uwojii n'Anambra Steeti ịnụta n'ọnụ ha banyere nke a mana ha azaghị oku ha.
Onyeisi ndị otu Injinia na Onisha bụ Ikenna Aniekwena ekwuola na ọ bụ amaghị ọrụ na ejighị ngwa ọrụ zụrụ oke kwaturu ya bụ ụlọ.
O kwukwara n'igwe e ji ruo ya bụ ụlọ ezughị n'ọnụ ọgụ. Na kama iji igwe milimita asatọ na ihe e jiri rụọ ya bụ ụlọelu atọ bụ milimita anọ.
Ọ sịkwa na blọkụ e jiri rụọ ya bụ ụlọ esighi ike ma tinyekwa na ndị otu ha ekporola aja ebe ahụ iji mee nnyocha puruiche.
Ifeanyi sị na ka ọ dị ugbua, ma ndị gọmenti ewerela ya bụ ala ebe arụrụ ụlọ ahụ.