You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Manchester City vs Watford: Man City eliela Watford na ndụ mee akwa ha
Watford agbaghị akahịa taa na Wembley mgbe Manchester City ji ọkpụ goolu isii chara acha nyụọ ha ịkpakwụ.
Ya bụ goolu malitere ịbata na nkeji iri abụọ na isii mgbe David Silva ji goolu mbụ gbaa akaahịa.
Ka a na-eme nke a, Raheem sterling zara aha ya na nkeji iri atọ na asatọ site n'imezu ya abụọ.
Ndị Manchester nyopuru na egwu ji Watford werezie goolu sawa ha ahụ.
Onye ọbụla malitere ịza "present" na ọnụ goolu ndị Watford.
Kevin Brunye mezuru ya atọ sịzịa Gabriel Jesus ya bịa gozie ha na nkeji iri isii na asatọ.
Ọ dị ka nke ahụ ezughị, Sterling mezuo nke ya atọ bụ nke mere ya ọkpụ isii.
Ka nke a na-eme, Wafford gosiri ike ha site n'ikpoko "yellow card" abụọ, ebe ndị Man. City ji otu.
Nke a mere ka asọmpị a bia na ngwucha mgbe Manchester City ji ọkpụ isii merie Watford were maburu iko FA afọ 2019.
Ihe a bu Iko nke ato Man City na-amabute n'afo a.