Lucifer: Ihe mere ụmụ Naijiria ji were ogbo igwe asa nwoke a ahụ na soshal midia

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọnụ bụrụ mbazu ọ garala ịmagbu onye omepụta ihe nkiri ụka a ma ama bụ Mike Bamiloye na ụlọọrụ ya bụ Mount Zion Ministry dịka ụfọdụ ụmụ Naịjirịa na-akatọ ha.

Ị makwanụ ihe kotere Bamiloye onye wepụtara ihe nkiri gụnyere 'Just a Little Sin', 'Ayamataga', Agbara Nla, Bood on the Altar' okwu na ụka na soshal midia?

Ọ bụ nwa ya nwoke a kpọrọ Joshua Mike Bamiloye dịka ọ katọrọ ihe nkiri mba Amerịka a kpọrọ 'Lucifer'.

Lucifer bụ ihe nkiri na-egosi Ekwensu dịka ọ hapụrụ ocheeze ya n'Ọkụmmụọ gbadata n'ụwa na Los Angeles dị n'Amerịka ebe o nyere ndị uweojii n'ọrụ nchekwa.

O bidoro wuwe na soshal midia dịka Neflix bụ ụlọọrụ na-egosi ihe nkiri n'elu ịntanet malitere igosi ya.

N'ozi o wepụtara n'igwe okwu Twitter ya, Joshua, nwa Mike Bamiloye kwuru na ekwensu nwere amamihe karịa mmadụ, na o ji ụzọ aghụghọ were nwayọọ na-ezubanye na mkpụrụobi ọtụtụ ndị mmadụ site n'ihe nkiri ahụ a kpọrọ 'Lucifer'.

O kwuru na okwu ya abụghị iji yie ndị mmadụ egwu kama ka ndị ụka Kraistị mụrụ anya dịka azụ, chekwa obi ha na mụọ ha n'ihe ga na-enye Chineke otito.

Okwu ahụ kpasuru ụfọdụ iwe nke mere ka ha katọọ nna Joshua bụ Mike Bamiloye, nwunye ya nakwa ụlọọrụ ha bụ Mount Zion Ministry maka ime ihe nkiri na-eyi egwu.

@TheFavoredWoman kwuru na ihe nkiri Mount Zion na-eyi egwu n'ihi na ọ bụ naanị maka ndị amusu na mmụọ ọjọọ.

@AustinYugo kwuru n'okwu ahụ ga-eme Lucifer wukarịa ma mee ka ndị mmadụ chọọ ikiri ya.

Mana ụfọdụ nọ na-azọtara ha:

@Duruchibuzor kwuru na Mike Bamiloye mepere anya ọtụtụ ndị mmadụ ma gbaa ihe ndị amusu na-eme n'anwụ.

@bimbolababs kwuru na dịka ụfọdụ na-akpọrị Mike Bamiloye na asampete nwunye ya, anya na-ahụta na ụmụ asa ha abụọ mụtara.

@Ndebe_ kwuru na ya mụtara ihe site n'ihe nkiri Mount Zion.