You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chelsea vs West Ham: E werela imi West Ham kpọọ anwụrụ
Chelsea azaala aha nna ha ma rigoo n'ọkwa nke atọ na Premier League ka ha ji goolu abụọ merie West Ham.
Otu abụọ a chịpụrụ ya taa ka ha zutere na Stamford Bridge.
Eden Hazard bụ onye egwu Chelsea ji aba mba chịkọrọ mmadụ ise n'otu ahịrị iji gbakaa neetị nke mbụ na nkeji 24.
Nke a mere ka Angelo Ogbonna bụ nwafọ Igbo na-agbara West Ham ritechara mpempe akwụkwọ edo edo maka amaghị eme ya na nkeji 11, dịka Cesar Azpilicueta nke Chelsea si rite na nkeji 82.
Ka ndị West Ham na-esi ọnwụ ọnwụ mgbe ọ fọrọ ntabianya ole na ole e ji egbuchi bọọlụ, Kepa Arrizabalaga nke Chelsea ritekwara akwụkwọ edo edo nke ya na nkeji 84.
Nke bụ eziokwu bụ na ya bụ egwu tara akpụ, ebe ndị Chelsea ji bọọlụ oge karịrị pasentị 55, hapụzịara ndị West Ham pasentị 45 nke ọzọ ka ha were lekọtawa onwe ha anya na be ha.
Hazard mere nke o ji bụrụ ọkaibe mgbe o tinyere goolu nke abụọ na postu ndị West Ham mgbe o ruru nkeji 90 kpọmkwem, iji were pịachie ya bụ egwuruegwu.
Mmeri a emeela ya ugboro atọ Chelsea na-emerikọta ọnụ kemgbe ọ bịara dị ka ihe mgbu ha o bidoro.