You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Osun Election: Ụlọikpe akagbuola ọnọdụ Adeleke maka asambodo
N'ikpe ya, Othman Musa bụ onye ọkaikpe n'ikpe ahụ kwuru na Adeleke bara ụlọakwụkwọ n'afọ 1976 mana o nweghi ihe akaebe gosiri na ọ gụchara n'afọ 1980.
Ọ gara n'ihu kwuo na asambodo nke Adeleke nyere ndị ụlọọrụ Inec bụ adịgboroja.
Mana onye ọkaiwu na-anọchite anya Adeleke kwuru na ọ ga-agbaha ya bụ ikpe n'ụlọikpe ka nke ahụ.
Asambodo ụlọakwụkwọ sekọndịrị bụ otu ihe n'ime ihe iwu nara onye ọbụla chọrọ ịzọ ọkwa na Naịjrịa
"Dada na eserese ahụ abụghị omenala anyị"
Ndị uweojii kwuru na ihe mere ha jị anwụchi ndị bu isi dada maka na ha nwereike ị nọ n'otu nzuzo dị icheiche.
Mana ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs bụ Bala Elkanah kwuru na agbanyeghi nke a, ndị uweojii e kwesighi ị na-anwụchi ndị ntoroọbịa ka o si maasị ha.
Nke a na-abịa dịka ndị mmadụ na-akpọ oku ka a machie SARS maka ebubo eboro ha na ha gburu otu nwoke bụ Kolade Johnson.
Kọmishọna ndịuweojii gara njem ụlọakwa na be ya iji ti ezinaụlọ ya aka n'obi.
Na ndọrọndọrọ
Inec adọtịala mkpọpụta mpụtara ntuliaka e mere na Rivas steeti rue elekere iri nke ụtụtụ echi.
"Onye ọwụwa anyanwụ kwesịrị ịbụ onye nke atọ na Naịjirịa!"
Otu kpọrọ onwe ha Coalition of South-East Leaders (COSEYL) kwuputara nke a mgbe ha na-etinye ọnụ n'etu APC ga-esi kee ọkwa ụlọomeiwu nke na-abịa.
N'akụkọ yiri nke a
Otu jikọtara ndị zọrọ ọkwa ịbụ ndị omeiwu n'ọwụwa anyanwụ ekwuola na ha kwụ aka chịbụrụ Abịa steeti bụ Orji Uzo Kalu n'azụ na njem ya ịbụ osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu.
N'emume NFF AITEO Awards
Ahmed Musa gosiri ụwa ihe e ji ụkwụ eme ka goolu o nyere n'asọmpi Iko Mbaụwa afọ 2018 nwetara ihe nrite bekee kpọrọ 'goal of the season'.
O nwetekwara "player of the year", ka Onome Ebi nwetere nke ụmụnwaanyị.
Lee ndị ọzọ chakere ka ọnwa ebe a: Ahmed Musa egosila ihe o ji bụrụ 'agụ' na NFF Awards 2019
Ị nụrụ nke na-eme n'Algeria?
Abdelaziz Bouteflika awụsala owa dịka onyeisiala mba Algeria n'ihi oke ngagharịiwe ndị mba ahụ na-eme na-akpọ ya oku ka ọ rịtuo n'ọkwa.
Onye chịrị afọ iri abụọ dịka ọ chịrị agbaligonu!
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji:
Akụkọ ga-amasị gị: