You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
2019 WWE WrestleMania 35: Kofi chiri Bryan ọnụ n'ala
Nwaafọ Ghana aha ya bụ Kofi Kingston abụrụla onye isi oji abụọ tụtụ ugo na egwuregwu mgba WrestleMania nke ngalaba WWE.
Maazị Kingston pụtakwara dịka onye isi oji nke anọ bụ ọka ibe na egwuregwu wrestling nke ụdị a n'ụwa dum. Ndi oso na-azu bụ mmadụ dịka Mark Henry, Booker T nakwa The Rock.
Mmadụ 80,000 pụtara ikiri mgba a ka Kingston ji agbam ụkwụ ejiri mara ya akpọrọ "Trouble in Paradise" na Bekee gbatuo Daniel Bryan.
Ndị egwuregwu "wrestling" na-amasị nwere ezigbote aṅụrị etu mgba jiri gaa.
Kofi Kingston anọrọla afọ iri na abụọ na ngalaba WWE.
Ihe ị maghị maka Kofi Kingston
Kofi Kingston ka o merichara
1. A ma ya dịka Kofi Kingston mana ezi aha nwa afọ Ghana a bụ dimkpa ka ibe ya nke WWE ugbua bụ Kofi Nahaje Sarkodie-Mensah
2. Kofi bụ onye isi ojii Afrika mbụ ga-erite nzere ọkaibe na mba ụwa na WWE dịka a na-arụbu WWE aka ikpa oke agbụrụ
3. Kofi na-azabu onye Jamaica ọtụtụ afọ ọ nọ na-agba mgba n'Amerịka dịka a mara ya oge ahụ dịka Kofi Nahaje Kingston
4. Ọ bụ nne ya gbara ya n'anwụ na ọ bụ onye Ghana, na ọ bụghị onye Jamaica nke mere ka Kofi machiere nne ya na ndị ezịnaụlọ ya ịgwa ndị ntaakụkọ ihe ọ bụla banyere ya
5. Kofi dị afọ iri atọ na asaa alụọla nwaanyị ma mụta ụmụaka nwoke abụọ