You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mother's Day 2019: Ihe mere n'Ụka Nne ndị ụka Katọlik na Anglikan
Mmemme ncheta ụbọchị ndị Nne na-ekpo ọkụ tata n'ụka Katọlik n'Nigeria.
Ụkọchukwu na-elekọta St Michaels Parish Asata Enugwu bụ Fada Callistus Anih toro ndị Nne dịka ihe nke ezinaụlọ ha were gwa ha ka ha nọrọ chukwu nso oge ọbụla ka ụmụ ha ghara ịgahie ụzọ.
Fada Anih Kwuputara nke a n'ozioma ụka ọkara maka ndị nne tata.
Ojikwa ohere ahụ rịọ ndị Nna na ụmụaka ka ha na-enye ndị nne nkwado n'ezinaụlọ ma na-enye ha ugwu kwesiri ekwesi.
Ndị nne yi uwe ejirimara ndị nne ụka katọlik were na-enwe aṅụrị n'uju tata.