Building collapse in Lagos: Ụlọ ọzọ adaala merụọ mmadụ anọ ahụ n'Oke Arin

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-akọwa na ụlọ ọzọ dara ma dakwasị ndị mmadụ na mpaghara Oke-Arin dị na Legọs Aịlandị.

Akụkọ ahụ kwuru na ụlọ ahụ dị na 57, Egerton Square, Oke Arin, dara ebe elekere atọ nke ehihie a.

Ndị ọrụ gbatagbata nke Legọs nke a kpọrọ Lasema n'aha ịchafụ kwuru na ọ bụ ndị na-akpa 'alụmi' ka ụlọ ahụ dagidere.

Ha kwukwara na e bugala mmadụ anọ ahụ ụlọọgwụ ozugbo ozugbo.

Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na e nyela ụlọ ahụ aka mbibi tupu ihe a e mee.