You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụgbọelu na-efe efe laghachiri azụ mgbe nwaanyị chefuru nwa ya
Otu ụgbọelu si mba Saudi Arabia aga Malaysia laghachiri azụ mgbe otu nwaanyị chefuru nwa ya.
Akụkọ kwuru na ụgbọelu ahụ efeliela mgbe nwaanyị ahụ gwara ndị ọrụ ụgbọelu na o chefuru nwa ya.
Ihe onyonyo na-efeghari gosiri ebe onye ndu ụgbọelu ahụ na-ajụ ndị ụlọọrụ ha ikike ịlaghachi.
"Chukwu nọnyere anyị, biko anyị enwereike ịlaghachi?" bụ ihe onye ndu ụgbọelu ahụ jụrụ tupu ekwe ya laghachi.
Ụgbọelu na-efe efe ekwesighi ịdatụ ma laghachi maọbụghị okwu ahụike mmadụ nakwa ịgbalahụ ọdachi.
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ