You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Tanka mmanụ agbịdị agbaala na Satellite Town dị na Lagos
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ụgbọala tanka na-ebu mmadụ agbịdị, enwurula ọkụ na-agbasasị n'ogige Satellite Town.
Ndị hụrụ ka ọkụ a na-agba, kwuru na mmanụ ụgbọala a malitere ịtapụ n'ala kemgbe ụtụtụ tupu ọ gbaa na mgbede a.
Otu onye BBC kpọrọ n'ekwentị kwuru na ndị na-emenyụ ọkụ ọgbụgba a na-akpọ "fire service" na bekee, kwụbụ ebe ahụ kemgbe ụtụtụ na-eme ihe gbasara ọkụ a, mana ha anọghịzị ugbua.
Etu ọ dị ugbua , ndị niile nọ n'ahịa "Agric building material" dị n'Abulado emechiela ahịa ma riwe mbo mbo ọsọ.
Anya hụrụnụ kwuru na ọkụ gbapịara otu ụlọ ahịa nwafọ Igbo na-ere nkụ n'akụkụ ebe ihe a mere.
Sochimaoge Madubo kwukwara na ndị ụlọọrụ mmenyu ọkụ ahụ wara ya bụ mmanụ ụgbọala na-atatu ụzọ na 'Canal'.