Na m ga-enye ndị ọchịehị ala? Ọ bụ asị ụmụ ekwensu - Uche Ogah

Uche Ogah bụ onye na-azọ ọkwa Gọvanọ n'Abịa steeti n'okpuru APC asaala ebubo eboro ya.

BBC Igbo nụrụ akụko na-agagharị gbasara Uche Ogah kwuru ọ ga-eme ma ọkwa gọvanọ Abia steeti rue ya aka.

Ihe ndị a gụnyere: ị nye ndị ọchịehi ọnọdụ ebe ehi ha ga na-ata nri nakwa ị rụ nnukwu ụlọ ekpere ndị alakụba na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuchitere Uche Ogah bụ Chima Obiwuru gwara BBC na ọ bụ ndị mmụo na "ụmụ ekwensu" bulitere ya bụ okwu.

O kọwara na ọ bụ ozi ekele Uche Ogah nyere onyeisiala Muhamadu Buhari mgbe o meriri dịka onyeisiala agba nke abụọ ka ha degharịrị

N'ebubo gbasara nne na nna Uche Ogah bụ ndị ugwu bịara ala Igbo, Obiwuru kwuru na eziokwu adịghị na ya.

Ọ kọwara na Uche Ogah bụ nwa afọ zuru ezu a mụrụ n'ala Igbo.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị