You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Election result 2019: 'Buhari gbanwee ndị na-arụrụ gị ọrụ'
Ka e mechara ntuliaka họpụtara Muhammadu Buhari ịchị Naịjirịa ọzọ, ndị mmadụ ekwuola ihe ha chọrọ n'aka ya.
Ebe ụfọdụ na-achọ ka ọ gbanwee etu o si achịbu n'agba nke mbụ, ndị ọzọ na-achọ ka o webata ihe ọhụrụ n'usoro ọchịchị ya.
Dịka ndị mmadụ gwara BBC Igbo ihe ha chọrọ n'aka Onyeisala Buhari n'ihe nkiri dị n'ime akụkọ a, ndị mmadụ kwulitekwara okwu ihe ha chọrọ na soshal midia.
Ha ji ihe ha kpọrọ "#Buharishould" nke pati APC kpalitere, wee na-ekwuputa uche obi ha ma mee ka o wuo ewuo ka ndị nọ n'ọchịchị nwee ike hụ ya mara ihe ha ga-eme maka ya.
Ihe ha chọrọ:
@olusegunthomas2 chọrọ ka Buhari mee ihe maka ọnọdụ ọkụ latrik na etu ndị mmadụ si akwụ ụgwọ ọkụ ha ejighi mee ihe ọbụla.
@Ebuka na-ajụ ma ọ ga-agbanwe onye bụ minista na-ahụ maka egwuregwu bụ Solomon Dalung nakwa ndị ọzọ.
Mana @the_receptor chọrọ ka o nye onyeisi JAMB ọrụ minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ.
@Kurtie66375842 chọrọ ka Buhari rụọ ụlọorụ ebe a na-esi mmanụ ọhụrụ nakwa rụgharịa ndị nke nọ anọ.
@deoziz chọrọ ka Buhari lebanye anya n'ọnụọgụgụ pati ole dị na Naịjirịa nakwa mee ihe gbasara etu e si eme ntuliaka.
@ErusiafeA chọrọ ka agha Buhari na-ebuso ndị merụrụ aka n'ọchịchị zuo ndị ọzọ n'ahụ, na-abụghị naanị ndị anọghị na pati ya.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: