APC Rivers: Ụlọikpe Mkpegharị ewezụgala ikpe wepụrụ ha n'ọsọ ọkwa gọvanọ

Ebe foto si, Tonye Cole
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ụlọikpe mkpegharị emela mkpebi ọhụrụ banyere arịrịọ otu pati APC nke Rivas steeti rịọrọ maka ikpe kagburu ntuliaka imeụlọ ha.
Ikpe ahụ nke ụlọikpe ukwu wepụtara na mbụ kagburu ntuliaka imeụlọ APC ma nye INEC iwu iwepụ aha pati APC na ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ na steeti ahụ.
Mana ụlọikpe mkpegharị kpegharịrị ikpe ahụ na Pọtakọt bụ isi obodo Rịvas steeti taa bụ Monde.
Ha kpebiri ka a ghara ime ihe ọbụla banyere ikpe nke mbụ ụlọikpe nta wepụtara nke a kpọrọ 'Stay of Execution' na Bekee.
Mkpebi ọhụrụ a nwereike imetụta mmachị ahụ ụlọikpe nyeeburu Inec banyere itinye aha onye ọbụla dịka onye ga-azọ ọkwa n'okpuru APC na Rivas steeti.
Chitzi Ogbumgbada bụ ọkaiwu gwara BBC na ikpe a so ikpe abụọ Magnus Abe bu onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'okpuru APC na Nyesom Wike bụ gọvanọ na-achị Rivas steeti ritere n'ụlọikpe ukwu na Pọtakọt n'afọ 2019 nke machiri APC iwepụta mmadụ ịzọ ọkwa gọvano na steeti ahụ.
Ọ sị; "nke a mere ka Inec wepụ aha ndị niile na-azo ọkwa n'okpuru APC na Rivas na ntuliaka 2019."
Mana Tonye Cole, bu onye nke ọzọ na-azọ ọkwa n'okpuru APC gara rịọ ụlọikpe mkpegharị ka o wezuga ikpe a.
Ogbumgbada kwukwara; "Ikpe a nwyere ihe abụọ.
- Ọ kagbụọla ikpe Ụlọikpe Ukwu.
- O nyela Inec ike itinye aha ndi ndọrọndọrọ APC niile n'akwụkwọ ntuliaka."
Ikpe Tonye Cole hibere maka ikpe Ụlọikpe Ukwu nyere kwesiri ịga n'ihu eche, mana nke taa nwereike kagbuo ya.
Ụlọikpe mkpegharị abụghị ejechaa ọ gwụ n'ihe banyere ikpe ndọrọndọrọ ọchịchị. E nwereike were ya gawa ụlọikpe mkpecha nke Bekee kpọrọ "Supreme Court".









