You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ohanaeze: Anyị etinyeghi ụbọchị ọgbakọ imeobi maka Buhari
Ọnụ na-ekwuru Ohanaeze bụ Chuks Ibegbu ekwuola na otu ahụ enweghị mgbe o ji maka onyeisiala Muhammadu Buhari were tinye ụbọchị ọgbakọ imeobi ha.
O kwuru na otu a akpaala maka ọgbakọ imeobi ahụ kemgbe ọnwa Disemba afọ gara aga, ma kwaa arịrị ihe mere e ji ebukarị ndọrọndọrọ ọchịchị abata n'okwu gbaasara ndị Igbo oge ọbụla.
Ụfọdụ ndị nkwado otu pati APC nọọrọ n'akwụkwọ akụkọ ndị e bipụtara ma boo otu Ohanaeze ebubo a n'ihi nkwekọrịta ha nwere iji nwee nzukọ imeobi ha ụbọchị Tọzde, abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Jenụwarị, 2019.
Ebubo a gara n'ihu kwuo na ọ bụ iji wunye aja na njem achụmnta vootu ntụliaka onyeisiala Buhari ga-eme na mpaghara ọwụwa anyanwụ mere otu Ọhanaeze jiri tinye nzukọ ha n'ụbọchị ahụ.
N'okwu ya mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụọnụ n'ekwentị, Maazị Ibegbu kọwara na o nweghi ihe mmegide dị n'ọgbakọ ahụ, kama na ọ bụ oge ha ga-eji kwupụta usoro ndị Igbo ga-eji mee ntụliaka ọkwa onyeisiala n'ọnwa Febụwarị.
O kwukwara na n'iji sọpụrụ onyeisiala nakwa ndị otu imeobi Ohanaeze so n'otu pati APC, a gbatịkwuola oge mbido ọgbakọ ahụ site n'elekere iri na otu nke ụtụtụ ka ọ bụrụzie elekere anọ nke ehihie.
Ibegbu kọwara na o nweghi onye ọ dị n'aka ịgwa otu a mgbe ha ga-eji eme nzukọ ha dika o si dị na nzukọ otu ndị ọzọ dịka Arewa, Afenifere, PANDEF nakwa ndị ọzọ.
Akụkọ ga-amasị gị: