You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
10-year E-passport: Ị ga-akwụli naira 70,000 maka ya?
Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa ebidola ikwu uche ha gbasara akwụkwọ njem ọhụrụ e wepụtara a kpọrọ 'International Passport' maka afọ iri.
Ọ bụ n'ụbọchị Tuzde ka onyeisiala Muhammadu Buhari nabatara akwụkwọ njem ọhụrụ a.
Ngalaba na-ahụ maka ọpụpụ na mbata(Immigrations) kwupụtara na ọnụ ya bụ akwụkwọ njem ga-abụ naira puku iri asaa.
Agwa ya bụ akwụkwọ njem ọhụrụ bụ ọbara ọbara dị iche na ndị ochie bụ agwa akwụkwọ ndụ, akwụkwọ ndụ.
Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya bụ akwụkwọ njem ọhụrụ:
Chiamaka Imoh kwuru na ọ dị ka ọ ga-eji akwụkwọ ngosi onwe dịka NIM iji mee njem maka ọnụ akwụkwọ njem a.
Toni Johnson kwuru na ọnụ a zuru iji chụpụ ndị ọchịchị n'ọkwa ha.
Cheta na mgbe e wepụtara akwụkwọ njem a ọhụrụ, otu onye ọrụ ngalaba ọpụpụ na mbata gwara BBC na ọ bụghị iwu na onye ọbụla ga-enweta ya bụ akwụkwọ njem ọhụrụ.
Gee ihe o kwuru n'uju ebe a.
Akwụkwọ ndịọzọ ga-amasị gị