10-year E-passport: Ị ga-akwụli naira 70,000 maka ya?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa ebidola ikwu uche ha gbasara akwụkwọ njem ọhụrụ e wepụtara a kpọrọ 'International Passport' maka afọ iri.

Ọ bụ n'ụbọchị Tuzde ka onyeisiala Muhammadu Buhari nabatara akwụkwọ njem ọhụrụ a.

Ngalaba na-ahụ maka ọpụpụ na mbata(Immigrations) kwupụtara na ọnụ ya bụ akwụkwọ njem ga-abụ naira puku iri asaa.

Agwa ya bụ akwụkwọ njem ọhụrụ bụ ọbara ọbara dị iche na ndị ochie bụ agwa akwụkwọ ndụ, akwụkwọ ndụ.

Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya bụ akwụkwọ njem ọhụrụ:

Chiamaka Imoh kwuru na ọ dị ka ọ ga-eji akwụkwọ ngosi onwe dịka NIM iji mee njem maka ọnụ akwụkwọ njem a.

Toni Johnson kwuru na ọnụ a zuru iji chụpụ ndị ọchịchị n'ọkwa ha.

Cheta na mgbe e wepụtara akwụkwọ njem a ọhụrụ, otu onye ọrụ ngalaba ọpụpụ na mbata gwara BBC na ọ bụghị iwu na onye ọbụla ga-enweta ya bụ akwụkwọ njem ọhụrụ.

Gee ihe o kwuru n'uju ebe a.

Akwụkwọ ndịọzọ ga-amasị gị